Winter Olympics: Lizzy Yarnold bụ onye mmerị asọmpi Skeleton

Jacqueline Loelling, Lizzy Yarnold na Laura Deas
Nkọwa foto, Jacqueline Loelling, Lizzy Yarnold na Laura Deas bụ ndị mmerị na asọmpị Skeleton

Emechaala asọmpị ọsọ skeleton winta olimpiks nke nwa Naịjirịa bụ Simidele Adeagbo so na ya.

Lizzy Yarnold nke Britain ritere ọlaedo, Jacqueline Loelling nke Germany ritere ọlaọcha, ebe Laura Deas nke Britain ritere ọlanchara.

Adeagbo bụ nwaaafọ Naịjirịa kpetere azụ n'oso nkwado anọ ha gbara tupu agbaa ọsọ ikpeazụ nke asọmpi a.

Ọtụtụ ndị Naịjirịa na-ekele Simidele Adeagbo maka mbọ ọgbara i so na asọmpị a.

Atiku Abubakar

Ebe foto si, Atiku twitter page

Nkọwa foto, Atiku Abubakar bụ osote onye isi ala Naịjirịa n'oge garaaga
Mohammadu Buhari

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Mohammadu Buhari

Chete na Simi ji ọnwa anọ we mee nkwado asọmpị nke a.

Seun Adigun, Ngozi Onwumere, Akuoma Omeoga na Simidele Adeagbo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Seun Adigun, Ngozi Onwumere, Akuoma Omeoga na Simidele Adeagbo bụ ndị mbụ na nọchite Naịjirịa na winta olimpiks.

Ndị otu Naịjirịa ọzọ na asọmpi oyi bụ winta olimpiks bụ Seun Adigun, Ngozi Onwumere na Akuoma Omeoga bụ ndị egwuregwu Bobsled.

Ha ga-ebido ọsọ nkwado ha n'ụbọchị iri abụọ n'ọnwa Febrụwarị.