Tottenham jịrị otu goolu meri Arsenal

Ebe foto si, Getty Images
Tottenham emeriela Arsenal na asọmpị iko Premiere leaque nke agbara taa.
Ọ bụ Harry Kane nke Tottemham bụ onye nyere goolu na asọmpị nke a.
Ugbu a, Tottemham erigolu bụrụ onye nke atọ n'asọmpị Premier League.
Ọ bụ Ben Davies bụ onye nyere Harry Kane bọọlụ tupu onyekwa goolu nke a bụ nke iri abụọ na atọ nke Kane na afọ asọmpị nke a.
Asọmpi nke a bụ oge nke atọ a meriri Arsenal n'usoro na afọ nke a.

Ebe foto si, Reuters
Ihe mere
Ọ bụ na nkeji iri isi na asatọ ka Arsenal nwere ike ị agbata bọọlụ rute nso ebe a na enye goolu.
Lacazette te gba mbọ i nye goolu mana mbọ ya niile amịhị mkpụrụ ọbụla.
Gịnị ga-eme n'ihu?
Asọmpị ọzọ nke Tottenham ga-agba bu na ubọchị iri na isi n'ọnwa Febụrụwarị
Arsenal na Man City nwere asọmpị nke ha na ụbọchị nke mbụ na onwa Maachi.










