Winter Olympics 2018: Naijiria na ala asaa ndị ọzọ ga-eso

Ala asatọ na mba Afrika ga-eso na egwuregwu Winter Olympics nke afọ 2018 ga-eme n'ime ala South Korea.

Maka na ala Afrika dị ezigbo ọkụ, obodo si Afrịka anaghị eso n'egwuregwu dị ichiche dika Skiing, Bobsled na Snowboarding.

Mana ọtụtụ ndị egwuregwu sị na Naijiria, Eritrea, Ghana, Kenya, Madagascar, South Africa, Morocco na Togo ga-eso n'asọmpi nke a na Pyeongchang.

Ihe a bụ mbụ ala ndị dịka Nigeria na Eritrea, na-eso n'asọmpi nke a.

Lekwa anya ka ị hụ uzọ i ga-esi hụ ndị egwuregwu mba Afrika ga-eso na Winta Olimpiks. Metụ foto ha aka ka ị mara ihe dị icheiche gbasara ha niile: