Conte: Onye nchịkọta Chelsea anaghị aga ebe ọbụla

Ebe foto si, Reuters
Agaghị achụ Antonio Conte n'ọkwa onye nchịkọta otu Chelsea n'agbanyeghi mmeri Watford ji goolu anọ merie ha n'abalị Mọnde.
Ekwughi ihe ọbụla gbasara ọkwa Conte ka emerichara ha, ebe onyere ndị egwuregwu bọọlụ ya ụbọchị ezumiike atọ.
Akụkọ si na Stamford Bridge na-egosi na onweghi uru ọ bara ma achụpụ Conte ugbua tinye onye ọzọ, maka na Chelsea ka nọ n'ọkwa nke anọ na tebulu premier league, ka na-agbakwa ịsọmpi Champions League na FA Cup.
N'agbanyeghi na a na-akwanye Conte ọkụ ugbua, ọgaghị eme ka echefuo na Conte bụ onye nchịkọta nke mbụ ga-erite 'onye nchịkọta nke ọnwa' n'ọnwa atọ nọkọrọ ọnụ (n'afọ Oktoba, Novemba na Disemba)
Ndị otu egwuregwu ya ọkwụ ya na-azụ?
Onyeisi ndị otu egwuregwu bụ Gary Cahill kwunyere onye nchịkọta ha sị na osighi Conte n'aka, na ndị otu ya kwesịrị 'ile anya n'ugegbe' ka emerichara ha na ụlọ ndị Watford.
Ọ sịkwa "ihe ọ bụla e kpebiri, ndị otu eguregwu nwere ụta n'ime ya
Onye nchịkọta a arụọla ọrụ a na-atụwaghị anya"
Onye nche goolu Chelsea bụ Thibaut Courtois kwunyekwara Conte sị "Anyị kwenyere n'ime ya ma kwenyekwar n'ime otu anyị
Anyị emeghi ọfụma ugboro abụọ, mana anyị na-agbalị ịlọghachị, chịkọta ọnụ ma gbawakwa ọzọ"

Ebe foto si, Getty Images
Ihe Conte kwuru
Oge BBC Redio gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara ebe ọkwụ akwụ, Conte kwuru "ọ bụ otu ihe ahụ. Anọm ebe a, na-agba mbọ irụ ọrụ ma tinyekwa onwe m n'ime ọrụ m. Nkwanyeọkụ? Kedụ nkwanyeọkụ ọ bụ? Gịnị bụ ọkụ a na-akwanye?"
Chelsea buliri iko n'afọ garaaga, nọzị n'ọkwa nke anọ, ebe ndị nọ n'isi bụ Manchester City ji pọintị iri na itoolu aga ha.









