You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Tanka bu ndịọrụ mba India efuola na mpaghara Bini
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Tanka mmanụ bu ndịọrụ Indịa ruru iri abụọ n'abụọ efuola na mpaghara mmiri a na-akpọ Gulf of Guinea n'ọnụ bekee na mba Bini na ọdịda-anyanwụ Afịrịka.
Anụbeghị olu ụgbọ ahụ edenyere aha na mba Panama kemgbe ụbọchị Tọọsday.
Nke a na-abịa ka akụkọ yiri ya mere n'ihe erughi otu ọnwa n'afọ Jenụwarị ebe ndịohiụgbọmmiri kpụụrụ otu ụgbọ ma hapụkwa ha ebe ndị nwe ya kwụrụ ụgwọ mgbapụta.
Ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ụgbọmmiri kwuru na ndịagha mmiri mba Bini na-achọ ụgbọ ahụ bu mmanụ ụgbọala ruru puku iri na atọ n'ọnụ ọgụgụ 'tonne'.
Minista na-ahụ maka ihe gbasara India na mba ndị ọzọ kwuru nke a n'elu igwe okwu Twitter: