You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Na ubọchị Kansa na ụwa niile, a na ajụ maka ohere inwete ọgwụgwọ
Naịjirịa so ndị mba ụwa ọzọ etinye anya n'ihe gbasara ụbọchị Kansa nke 2018, ebe ha lebara anya na etu ndị mmadụ ga-esi enweta ohere ime redioterapi nwere ike ịgwọ ha.
Ndị ọkacha mara na-ekwu na kansa nke ara, nke akpamamịrị, nke umeji na nke ọnụ akpa nwa (cervix) bụ ọdịrị kansa nke kachasị enye ndị mmadụ nsogbu na Naịjirịa.
Ndị International Atomic Energy Agency (IAEA) kwuru sị na enwere nanị ngwaọrụ redioterapi atọ na-arụ ọrụ na gburugburu Naịjirịa, nke kpatara ha ji chere na Naịjirịa so n'obodo ndị kacha nwee mkpa ngwaọrụ a.
Nyocha ndị otu Radiation Oncology mere n'ụlọọgwụ ndị mahadum dị na Ibadan bụ University College Hospital (UCH) n'afọ 2016, ha chọpụtara na ihe ruru pasenti iri asatọ na-arịa ọrịa kansa enweghi ego ha ji akwụ ụgwọ iji nwete redioterapi nwere ike ịgwọ ha.
Ha chọpụtakwara na ọ na-arakwa ndị na-ebighi nso ebe ngwaọrụ a dị ahụ inwete ọgwụgwọ
Ihe ndị mmadụ na-ekwu na igwe okwu ọhụrụ (social media)
Ndị mmadụ tinyere ọnụ n'ihe gbasara ọrịa kansa na ụzọ esi ekpochapụ ya.