Mberede ụgbọoloko egbuola mmadụ abụọ, ma merụọ iri ise ahụ

Reuters

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Reuters
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụgbọoloko abụọ kụkọrọ ihu na ihu na South Carolina dị na mba Amerịka, wee gbuo mmadụ abuọ ma merụọ ihe karịrị iri asatọ ahụ.

Ihe mberede a mere taa bụ ụbọchị uka.

Ọ bụ ụlọọrụ oloko a na-akpọ Amtrak nakwa ọzọ a na-akpọ CSX nwe ụgbọoloko ndi a ihe mberede a mere.

E bugara ndị merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Onye na-ekwuchitere ndị ụlọọrụ nzọpụta na South Carolina kwuru na ndị merụrụ ahụ na mberede a gbajiri ọkpụkpụ.

Ha kwukwara na galọnụ mmanụ ugbọala ruru puku ise wufuru n'ala, mana onweghị ihe omere maka na ọkụ agbaghị ya.

Akụkọ ka na-abịa.