Ndị mbiarambiara anọ ka awakpooru na mba Senegal

Ndị nchekwa na Senegal kwuru na ndị isi aba okpu wapooru ndị mbiarambiara si Europe na mpaghara Senegal a na-akpọ Casamance taa.
Onyeisi ndị uweojii na Diouloulou, Mamadou Samba, gwara ndị nta akụkọ a na-akpọ Senegalese Press Agency (APS) na ezuru mmadụ anọ a si mba ofesi ori ma kwaso ụmụmnwaanyi atọ nọ nime ha iko n'ike.
Amachaha ndị kpara ike a, mana na mbido onwa a, egburu ụmụ okorobia iri na atọ (13).
Mba Gambia kewara Casamance na isi obodo Senegal bu Dakar. Na mbụ, o bụ bụ ebe ndị mbiarambiara na eje ọfụma tupu ọrụ na ahụ maka mbiarambiara eme nyasa maka ihe ndị ekweghịekwe na-eme na mpaghara ahụ.
Mana tupu ihe mere jiri me, ana ebi na udo ebe ahụ.




