You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Zinedine Zidane nọọzi n'oche ọkụ na Madrid
Zinedine Zidane ekwuola na o jịzi ndidi agafe oge ọnọdụ ọjọọ ọ na-agafe ugbua dịka onye nkuzi otu egwuregwu bọọlụ Real Madrid.
Ọnọdụ ya dịka onye nkuzi otu egwuregwu ahụ ga-agbado ụkwụ na ndị otu ya ime nke ọma n'asọmpi Uefa Champions.
Nwafọ mba France a kwuru: "Ọ bụ ihe mgbakwoju anya."
" Nke a bụ oge kachara m njọọ dịka onye nkuzi. Enweghị m obi abụọ gbasara ihe ọbụla mere n'asọmpi a. A na m anara ụta maka ihe ọ bụla mere."
Madrid jiri otu ọkpụ gọọlụ merie na ụkwụ nke mbụ n'asọmpi ahụ, ebe ejiri ọkpụ abụọ asatara otu merie ma gbapụ ha n'ụkwụ abụọ n'asọmpi Copa del Rey.
Mgbe ajụrụ ya ajụjụ ọnụ gbasara ọnọdụ ya na Madrid, o kwuru na ọ ga-abụ ma ha mee nke ọma n'asọmpi Uefa Champions.
"Otu anyị jiri bido asọmpi a adịghị mma, maka nke a obi adịghị m nma. Amaghị m ihe na-eme."
Aga m achọta ụzọ anyị ga-eji pụta na nsogbu a. Anyị achọtala ụfọdụ.