Na Zambia, afọ ọsịsa abadola ndị ṅụrụ ọgwụ ike dimkpa

Ebe foto si, AFP
Akụkọ onye ntaakụkọ BBC, Kennedy Gondwe wetere site na Zambia na akọwa na ebujere ụmụ nwoke atọ ụlọ ọgwụ maka ha egosiri njirimara ọrịa kọlera mana nchọpụta e mere gosiri na ha ṅụrụ ọgwụ ike dimkpa.
Kemgbe afọ gara aga ka Zambia na- ebuso ọrịa Kọlera batara obodo ha agha.
Kọlera egbuola mmadụ iri asaa, ma metụ mmadụ ruru puku atọ.
Mana, akụkọ na-egozi na mmadụ atọ a esoghị na ndị kọlera metụtara.
Ihe ozi si Zambia na- akọwa bụ na ọ bụ mmanya ka ndị atọ ahụ no na-aṅụ tupu ha banye ịṅụ ọgwụ ike dimkpa a na-akpọ, 'mvubwe' na mba ahụ.
Onye ọrụ gọọmentị mpahara Zambia ebe ihe a mere bụ Chanda Kasolo, gwara BBC na ka mmadụ atọ a bidoro igbọ agbọ, e buru ha gawa ebe a na-agwọ ndị Kọlera metụtara.
Ka e mere ha nyocha, a chọpụtara na ọ bụ ọgwụ ike dimkpa ka ha ṅụrụ.
Ndị a ka nọ n' ụlọọgwụ, mana ha na-adị mma.








