Buruji Kashamu Burial: Buruji alaala mmụọ dịka eliri ya n'Ijebu-Igbo taa

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

E liela Buruji Kashamu bụbu sịnetọ na-anọchite anya Ogun-East n'ụlọomeiwu n'obodo ya bụ Ijebu-Igbo taa.

Eliri ya dịka usoro ili ozu ndị alakụba na-eso siri nye, nke bụ na a ga-eli onye ọbụla nwụrụ anwụ n'ime otu ụbọchị ha nwụrụ.

Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị gụnyere gọvanọ na-achị Ogun steeti bụ Dapo Abiodun so gaa mgbaru n'ụlọ ya dị n'Ijebu-Igbo.

Cheta na Kashamu nwụrụ site n'ọrịa coronavirus n'otu ụlọọgwụ dị na Legọs.

Ihe onyonyo a na-egosi ebe igwe mmadụ pụtara ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ n'ọnwụ ya.

'Buruji Kashamu gbanahụrụ ikpe kwụ ọtọ mana ọ gbanahụghị ọnwụ' - Obasanjo

Dịka ọnwụ omeiwu Buruji Kashamu malitere iwu, onye chịbụrụ dịka onyeisiala Naijirịa bụ Olusegun Obasanjo degarala gọvanọ Ogun steeti akwụkwọ mgbaru maka ọnwụ omeiwu ahụ.

O kwuru na dịka Kashamu ji aghụhọ gbanahụ ntaramahụhụ dịrị ya, na o nweghị ike ịgbanahụ ọnwụ mgbe ọ bịara.

Obasanjo dere sị "ka Chukwu gbaghara ya mmehie ya ma nabata mkpụrụobi ya na 'Aljanah".

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka akwụkwọ ozi Obasanjo

Ihe mere ọnwụ Kashamu ji ada ụda

Omeiwu Ben Murray-Bruce bụ onye kwuputara na ogbo ya bụ Kashamu anwụọla n'ụbọchị Satọde n'ụlọọgwụ First CArdiology Consultants nke dị na Legọs.

O kwuru nke a n'elu Twitter ya mere o jiri malite iwu na soshal midia.

Kashamu gbara afọ iri isii na abụọ mgbe ọ nwụrụ.

Onye bụ Buruji Kashamu

Kashamu bụ onye ndọrọndọro ọchịchị ma bụrụkwa onye omeiwu na Naijirịa ọ nọchitere anya mpaghara Ogun-East n'agba nke asatọ nke ọgbakọ ndị omeiwu na Naịjiria.

Omeiwu Kashamu bụ onyeisi ụloọrụ Western Lotto Imited na Naijirịa.

Kashamu rụkwara ọrụ dịka osote onyeisi oche nzụkọ ndịomeiwu na-ahụ maka mmekọ steeti na mpaghara ọchịchị ha.

Kashumu ji ọkọlọtọ Peoples Democratic Party (PDP) zọọ ọkwa gọvanọ Ogun steeti n'afọ 2019, mana Dapo Abiodun nke All Progressives Congress (APC) meriri ya.

Ọ lụrụ nwunye ma mụta ọtụtụ ụmụ.

Akụkọ ga-amasị gị