Coronavirus: Anyị a ga-amalite ịṅụ vitamin D?

Ị nọ n'ime ụlọ kemgbe etiri iwu onye apụla ezi maka mgbochi nje coronavirus mere na ọtụtụ mmadụ anaghịzị anya anwụ bụ ebe ha sị enweta vitamin D.

Ọ bụ site na ịpụ n'anwụ ka ọtụtụ sị nweta ya bụ vitamin bụ nke anụahụ anyị na-eme ma anyị pụọ n'anwụ.

Mana kedụ ihe anyị nwereike ime gbasara ya, kedu uru ọ baara mmadụ?

Kedụ ndụmọdụ ha nyere?

Agwalaarị ndị bị n'Yurop ka ha malite ịṅụ mkpụrụ ọgwụ vitaminD dị 10 "micrograms" kwa ụbọchị malite n'ọnwa ọktoba rụọ Maach 2021, ma ọ bụ mgbe ọbụla maọbụrụ na ha enweghị ohere ịpụ n'ezi.

Ndị ọrụ ahụike in Ingland gwara ndị mmadụ ka ha na-aṅụ vitamin D mgbe ọbụla kwa afọ maọbụrụ na:

  • Ị naghị apụ ezi mgbe niile.
  • Ma i biri na ụlọ nlekọtaanya (care home).
  • Ị na-enyi akwa na-ekpuchi gị ahụ niile mgbe niile.

Ndị isi ojii nwekwara ike ha agaghị na-enwetacha nke zuruoke ma ọ bụrụ na ha anaghị apụ ezi.

Ndị ọrụ ahụike nke Scotland na nke Welsh gwakwara ndị mmadụ otu ihe ahụ mgbe a sị ha apụla ezi.

Sara Stanner nke "British Nutrition Foundation" sị "ịnọ n'ụlọ dịn oke mkpa, mana ọ bụrụ na ụfọdụ n'ime anyị anaghị nweta anwụ ka o kwesiri, anyị kwesiri ị na-aṅụ mkpụrụ ọgwụ vitamin D".

Kedụ ihe Vitamin D ji dị oke mkpa?

Vitamin D dị mkpa na-idozi ahụike eze, ọkpụkpụ nakwa uruanụ.

Ụkọ ya n'ahụ nwere ike ibute nkwarụ ọkpa Bekee kpọrọ "rickets" n'ụmụaka maọbụ nke ha kpọrọ "osteomalacia" n'okenye.

Mmụta na-ekwu na vitamin D nwereike ime ka ahụ mmadụ merie ọrịa dịka onyi maọbụ nke Bekee kpọrọ "flu" mana e nweghị nkwekọrịta na ọ nwereike ịkwalite nche na-enyere ime ahụ aka nya ọrịa bụ "immune system' na Bekee - ndị kwe ndị ekwe ka dị na ya bụ ụmụta.

Ọ mụ ṅụwa vitamin D gbanyụụ?

Mbanụ. Ọ bụ eziokwu na ya bụ ọgwụ dị mma mana ịṅụwazi ya mgbe ọbụla nwere ike ibute ọgbataujie n'ọdịnihu.

Ọbụrụ na ịchọọ ịṅụwa vitamin D:

Ụmụaka dị agbata afọ 0 rụọ na 10 ekwesighị ịnụ karịa "micrograms" 50.

Ụmụaka na-erubeghị afọ 12 ekwesighi ịṅụ karịa "micrograms" 25.

Ndị okenye ekwesighị ịṅụ karịa "micrograms" 100 kwa ụbọchị, ihe ị kwesiri ịṅụ bụ micrograms 10 n'ụbọchị.

Mgbe ụfọdụ, ndị dọkịnta nwekwara ike ịnyefe ya oke mgbe onye ahụ nwere ụkọ vitamin D n'ahụ ya.

Ndị nwere ọrịa imeahụ dịka ọrịa uhie ekwesighị ịṅụ vitamin D otu ọbụla.

Ọ nwereike ịgwọ coronavirus?

Mbanụ. Onweghị mmụta gosiri na ọnwereike igbochi mmadụ ibute ya bụ ọrịa.

Mana ndị ọkachamara na-ekwu na ọ nwekaraike ịnyeaka n'oge a.

Mkpụrụọgwụ vitamin D ga-ebulite ahụike onye ụkọ ya dị n'ahụ ṅụrụ ya.

Ụfọdụ nchọcha gosiri na coronavirus nwereike imesi onye ọbụla nwere ụkọ vitamin D n'ahụ ike.

Mana ndị ahụ e jiri mee ya bụ nchọcha nwekwara ọrịa ndị ọzọ siri ike dịka ọrịa obi bụ nke mere ka o sie ike ịkwekọrịta na ya bụ nchọcha.

Ndị ọkammụta na Spen na France nọ n'ọrụ ugbua ịchọpụta ma ọnwere ka vitamin D si enyere ndị bụ nje coronavirus aka.

Ọkammụta n'ihe gbasara ahụike n'UK bụ Jon Rhodes sị na Vitamin D nwere ike ịme ka ahụ mmadụ ghara ịza aza ebe ụfọdụ nọchacha ndị ọzọ sị na ọnwereike ịme nche ime ahụ mmadụ ịdaa mba nke nwere ike ịme ka coronavirus "puo nku" n'ime ahụ onye bu ya.

Nchọpụta a nwereike ịdị mkpa maka ndị coronavirus mesigoro ike na ngụ ha bụ ebe ọbutegoro oke ọzịza Bekee kpọrọ "cytokine storm".

Mana nchọcha ka na-aga n'ihu gbasara nke a.

Ebe ka m ga-esi egote vitamin D?

A na-ere ya n'ụlọahịa nakwa kemist ụfọdụ.

Onyereike ịbụ mkpụrụogwụ vitamin D naanị ya maọbụ nke a gwara ọgwa ya na "multivitamin" ndị ọzọ.

Ndị ọkachamara sị ka ị ghara igote karịa oke ị chọrọ ka ibe gị were hụ nke ha gotere..

Ngwe ndị ọzọ ana edepụta n'ololo Vitamin D bụ D3.

Vitamin D2 na-esi na nrị apụta, ebe vitamin D3 na-esi n'ahụ mmadụ.

E nwekwere nke ụmụaka.