You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Luka Jovic: Real Madrid azụọla Luka Jovic ebe ego bere
Otu egwuregwu bọọlụ Real Madrid na mba Spain eburula nde kwuru nde yuros gaa zuta nwata nwokorobia a na-akpọ Luka Jovic.
Jovic bu onye si mba Serbia nọbu otu egwuregwu Eintracht Frankfurt dị na mba Germany, mana akụkọ na-ekwu na Real Madrid ekwetala ịkwụ ihe kariri nde pound iri ise ( £50m) i ji zụrụ ya.
Real Madrid kwetakwara na ha ga na-akwụ Jovic nde Euro asatọ na ụma (£8.7m) kwa afo wee ruo afọ isii ya bu nkwekorịta ga abịa n'isi njedebe. Madrid ga-akwụkwa.
Aka na-elekota Real Madrid bu Zinedine Zidan ekwubuolarị na ọ ga-azụta ọtụtụ ndi ọgba bọọlu ọhuụrụ iji wee wulite otu ya, tụmadi ka ha gbachara ọnyụpa na agba futbọl nke gara aga.
A na-atụ anya na Real Madrid ga-azukwa onye otu futbọl Chelsea a na-akpọ Eden Hazard n'oge na-adịghị anya.
Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya:
@omoissyy tinyere ihe ịkpa ọchịna-ekwu na Jovic ga-elelị Bale na Benzema.
@Blue_Footy anaghị akwado otu egwuregwu ọbụla na Spain mana ugbua m ga-ebido na akwado Real Madrid.
@Mrhappy1998 kwuru na oge ọgwụgwụ oge eruola afọ iri na otu ha na Bezema.
Akụkọ ga-amasị gị: