Nigeria Election 2019:: E meela APC taa kpuchie ọnụ na steeti ahụ

Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa akachapụla ikpe arịrịọ ndị otu APC dị na steeti Rivers gbasara ntuliaka 2019.

Otu APC na steeti ahụ nke minista na-ahụ maka njem mara n'ụlọikpe ukwu aka dị na Rivers maka etu ha si kwụsị Pati ha ịwepụta ndị ga-anọchite anya ha na ntuliaka na-abịanụ.

Nkpebi ụlọikpe ukwu gbadoro ụkwụ na mkpesa otu APC nke Magnus Abe na-achị kpesara ya.

Abe kwuru ka ụlọikpe kagbuo ntuliaka imeụlọ ndị otu APC Amaechi hibere mere.

The Independent National Electoral Commission (INEC) gbadoro ụkwụ na nkpebi ụlọikpe ọkachasị wee hapụ ikpọpụta aha onye ọbụla si pati APC isonye na ntuliaka na-abịanụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: