You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Portharcourt: Ọgbaghara adaala na ntuliaka ha mere
Ogbagbara mere na ntuliaka ndị Rivers steeti
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ọgbaghara adaala na ntuliaka ịhọpụta onye ga-anọchi anya obodo Portharcourt n'ụlọome iwu ndị Rivers Steeti.
Akụkọ a kwuru na ndị akpụ obi ji egbe maburu igbe eji eme ntuliaka, ebe ndị pati APC na PDP na-ebo onwe ha ebubo n'ihe butere ọgbara ahụ.
Ndị mmadụ na-eri uju ọnwụ Kofi Annan
Otu United Nation, mba Gana nakwa ụwa niile na-eri uju n'ọnwụ onye odeakwụkwọ United Nation n'oge gara aga bụ Kofi Annan.
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari n'okwu iti aka n'obi ya kwuru na Kofi Annan bụ nwoke dị umeala ma hụkwa mmadụ n'anya.
Ndị uweojii anwụchiela ụmụnwaanyị Ipob
Ndị uweojii n'Imo steeti anwụchiela ụmụnwaanyị Ipob ruru otu narị na-eme ngagharị iwe n'Owerri ụnyaahụ
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Andrew Enwerem kwuru na onweghi onye nwụrụ oge ha na-anwụchi ụmụnwaanyị ndị a.
N'Egwuregwu:
Otu FIFA ajụla atụmatụ njem nleta minista egwuregwu bụ Solomon Lalong chọrọ ime n'isi ụlọọrụ ha dị na Switzerland.
Otu egwuregwu bọọlụ dị na mba spen ga-amalite asọmpi La liga Santander nke afọ 2018 banyere 2019 n'abalị a.
Gee akụkọ anyị nke abalị a
Lee ihe nkiri nke taa