Inec: Anambra gaanụ nata akwụkwọ ntuliaka ụnụ
Ọtụtụ akwụkwọ ntuliaka ka ka nkụ n'Anambra - INEC

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiụlọọrụ ngalaba na-ahụ maka ntuliaka n'Anambara steeti bụ Nkwachukwu Orji ekwuola na akwụkwọ ibinye aka ruru otu narị iri atọ n'anọ bu akwụkwọ mbinye aka dị n'ụlọọrụ ha ugbua.
O kwuru na INEC ga-arịọ ndị isi obodo dị iche iche na steeti ahụ ka ha were akwụkwọ ntuliaka ndị na anaghị anata yabụ kaad were nye ha.
Nnochirionye Afunanya bụ onye na-ekwuchiri ndị DDS ọnụ

Ebe foto si, OLA ONEMOLA
Ndị ọrụ nchekwa obodo na nzizo akpọrọ Department of state services emeela otu nwafọ Igbo aha ya bụ Nnochirionye Afunanya dịka ọnụ na-ekwuchiri ụlọọrụ ha.
Cheta n'ime afọ atọ oge onyechiburu ụlọọrụ ahụ bụ Lawal Daura, DSS eweghị ọnụnaekwuchitere ha.
Aretha Franklin anwụọla

Ebe foto si, Getty Images
Na mba ofesi, nwanyị oluọma nke ama ama bụ Aretha Franklin a nwụọla na mba Amerika.
Ọ bụ oti ọrịa Kanca gburu Franklin dị afọ iri asatọ n'isi.
Spain akpapụla Naịjiria

Ebe foto si, Getty Images
N'eguwregwu, Spain akpapula otu Falconets n'asọmpị iko mbaụwa nke ndị ụmụnwaanyị nọ n'okpuru afọ iri abụọ.
Spain meriri Nigeria ọkpụ abụọ asatara otu.
Gee akụkọ anyị nke abalị a
Lee ihe nkiri anyị











