Ihe Joe Igbokwe kwuru maka FFK na "sit at home" Ipob

Aha onyonyo, Ihe mere mgbata Fani Kayode batara APC ji ewe m iwe - Joe Igboke

Na mkparịtaụka a ya na BBC Igbo nwere Joe Igbokwe kwuru ihe mere ya ji agbarụ ihu maka etu patị APC siri nabata Femi Fani Kayode.

Maazị Igbokwe sị na ihe mere ya ejighi ahụ Maazị Fani Kayode dịka ezigbo mmadụ bụ etu o "si na-amịgharị amịgharị".

Ọ sị na mbata nwaamadị a batara patị ha bụ maka ụdị mmadụ ọ bụ.

Ọ sị, "ịhụ onye na-ekwusasị, ya kwuo nke a taa o kwuo ọzọ echi, ị mara na onweghi ihe e ji onye ahụ eme."

Ọ gakwara n'ihu kwuo na okwu Fani Kayode dị iche makana ha agbarụghị ihu maka ndị ọzọ batara patị ahụ.

Ọ sịkwa na ya anaghị ekwu maka ya, mana o nwere ọtụtụ ndị tara patị ahụ ahụhụ enwebeghị onye tiri ha aka n'obi.

Gere ọtụtụ ihe ndi ọzọ o kwụrụ n'onyonyo a.