Femi Fani-Kayode: Gọọmenti etiti kwesiri ịge ndị dị ka Nnamdi Kanu na-achọ nwereonwe ntị
Onye bụbụ mịnista na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naịjirịa, Femi Fani- Kayode ekwuola na gọọmenti etiti kwesiri ịge ndị niile na-achọ nwereonwe ha site na Naịjirịa ma mata ihe bụ mkpa ha.
O kwuru na o nwere ihe mere Nnamdi Kanu bụ onye ndu 'Indigenous People of Biafra' ji aba mba maka mmegbu a na-emegbu ndị Igbo.
Ihe ndị ọzọ o kwuru maka nwụchịgharị Nnamdi Kanu dị n'ihe nkiri a dị ebe a. Lee ya n'uju.