You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Princess Diana: Etu onye ntaakụkọ BBC si jiri aghụghọ nweta mkparịtaụka n'aka nne William na Harry
Nwa Princess Diana nke mba Briten bụ Williams akatọọla ụlọọrụ mgbasaozi BBC maka etu ha siri gbaa nne ya ajụjụọnụ nke o kwuru so kposaa ọdịmma dị n'etiti nne na nna ya ma mee ka nne ya nwe nsogbu ịtụ oke egwu.
BBC mere nnyocha imeụlọ nke ha wepụtara n'ụbọchị Tuzde nke gosiri na ha agbasoghị ụzọ kwesịrị ekwesị na etu ha siri gbaa Diana ajụjụọnụ n'afọ 1995 ebe ọ nọ kọọ ọtụtụ ihe zoro ezo na-eme n'Obieze Briten oge ahụ.
Na mkparịtaụka ahụ nke wuru ewu n'ụwa niile, Diana gwara onye ntaakụkọ BBC bụ Martin Bashir na "anyị dị atọ n'alụmdinanwunye anyị " bụ okwu o kwuru iji rụtụ aka na Camilla Parker Bowles bụ nwaanyị ya na di ya Charles na-adị na mma oge ahụ.
Nnyocha BBC gbara n'anwụ na Martin Bashir gosiri nwanne Diana bụ Earl Spencer akwụkwọ ụlọakụ adigboroja iji nweta ohere ịgba Diana ajụjụọnụ.
Akwụkwọ ụlọakụ ahụ gosiri etu otu ụlọ akwụkwọ akụkọ siri kwụọ otu n'ime ndị ọrụ Obieze ụgwọ iji nweta akụkọ.
Bashir onye gọburu na o nweghị akwụkwọ adigboroja ọ bụla o jiri nweta ohere mkparịtaụka ahụ kwetara na ọ bụ otu onye ọrụ BBC na-eme nka eserese nyere ya aka ịkpụ akwụkwọ ahụ.
BBC na Bashir arịọla mgbaghara ma degakwara ụmụ Diana bụ William na Harry akwụkwọ ozi.
Dịka BBC gbachara ihe mere n'anwụ, Williams ọkpara Diana ma bụrụkwa 'Duke' nke Cambridge kwuru na ya bụ ihe dị 'nnukwu mwute' n'ihi na nne ya amataghị na a ghọrọ ya aghụghọ tupu ọ nwụọ.
Harry bụ 'Duke' nke Sussex na-eche na ndị ntaakụkọ so mee ihe nne ya jiri nwụọ ọnwụ erughị erụ.
O kelere BBC maka ime nchọpụta ahụ iji gbaa eziokwu n'anwụ.
Mana ọ kwara arịrị na ụfọdụ ndị ntaakụkọ ka na-akpa ụdị agwa a.
Ndị uweojii mba ahụ ekwuola na ha ga-etinye anya na nnyocha ahụ pụtara ọhụrụ na-agbanyeghi na ha kwubuola na ọ bụghị mpụ.
Onye bụ Princess Diana?
Princess Diana bụ nwunye Prince Charles, Ọkparaeze nke Wales nakwa nne Prince William na Prince Harry.
Ya na Charles gbara akwụkwọ na St Paul's Cathedral dị na Lọndọn n'afọ 1981.
Ha kewara n'afọ 1996.
Diana, onye mechara nwụọ n'ihe mmberede okporoụzọ n'abalị 31 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1997.
Onye bụ Martin Bashir?
Martin Bashir gbara afọ iri ise na asatọ bụ otu n'ime ndị ntaakụkọ a ma ama na mba Briten.
Ọ bụ onye Pakistan a mụrụ na mba Briten.
Bashir, onye mere mkparịtaụka ahụ oge ọ bụ obere onye ntaakụkọ oge ọ gbara Diana ajụjụ agbatụọla Michael Jackson n'afọ 2003.
Ọ pụrụ na BBC n'afọ ga rụọrọ ọtụtụ ụlọọrụ akụkọ nọ na mba Amerika ọrụ
Mana o mechara lọghachị BBC n'afọ 2016 bụ ebe ọ na-arụ ọrụ dịka onyeisi ndị akụkọ metụtara okpukperechi tupu o tinye akwụkwọ arụkwaghịm n'ọnwa Mee afọ 2021, sị na ọ bụ n'ihiu ọnọdụ ahụike ya.ahụ
Lord Grade bụ onyeisioche BBC malite afọ 2004 na 2006 sị naBBC igbuchi ihe mere ka njọ karịa ihe Bashir mere
"O were afọ 25 inweta eziokwu. Ọ bụrụ otu a, kedị ihe ndị ọzọ BBC kpuchiri anyị amabeghị maka ya."
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: