Daniel Lewis Lee: Egbuola ya dịka ụlọikpe kachasị nyere n'iwu

Egbuola Daniel Lewis Lee dịka ụlọikpe kachasị na mba Amerịka nyere iwu sị ka e gbuo ya site n'ikpe ọnwụ a mara ya maka igbu otu ezinaụlọ.

Ogbugbu Lee bụ nke mbụ a na-egbu onye a mara ikpe ọnwụ kamgbe afọ iri na asaa gara aga.

Kedụ ihe Daniel Lewis Lee mere?

A mara Daniel Lewis Lee ikpe ọnwụ maka igbu otu ezinaụlọ bi n'Arkansas n'afọ 1996.

Lee, tara ezinaụlọ a dị mmadụ atọ ahụhụ tupu o gbuo ha ma were ozu ha tukpuo n'ime mmiri.

E hiwere igbu Lee n'ọnwa Disemba afọ 2019, mana agbatịrị ikpe ya mgbe ụlọikpe gbochiri ikpe ọnwụ ya.

Kedụ ka ikpe ya si gaa?

A kwụsịtụrụ igbu ọtụtụ ndị a mara ikpe ọnwụ mgbe otu ọkaipe sị na a ka nwere ọtụtụ okwu a ga-arọzi ukwu.

Ndị nọ na mkpọrọ sị na ọgwụ ike a chọrọ iji gbagbuo ha bụ ntaramahụhụ ọjọọ nye ha ma bụrụ kwa imegide ikike dịrị ha.

Mana ụlọikpe kachasị sị ka a gaa n'ihu gbuo ya site na ntuliaka ha mere nke pụtara bụ (5-4 "execution may proceed as planned")

Onye ọkaipe na mba Amerịka asịla ka akwụsịtụ ogbugbu a chọrọ igbu nwamadị a a kpọrọ Daniel Lewis Lee dịka ọ fọrọ awa ole na ole ka e gbuo ya.

Ọkaikpe Tanya Chutkan nyere iwu mmachi a na Mọnde dịka ọ fọdụrụ nwa obere oge ka e were ọgwụ gbagbuo ya na steetị Indiana.

Ọ sị na e nwere ụfọdụ ebubo banyere iwu nke ụlọọrụ na-ahụ ikpe na mba Amerịka na-azarabeghi ọnụ ha.

Mana ugbua ọkaikpe Chutkan agbatịkwala ogbugbu Lee na mmadụ anọ ndị ọzọ.

Ndị nọ na mkpọrọ mere mkpesa na usoro i ji ọgwụ agbagbu ha megidere ikike dịrị ha.

Nchọpụta gosiri si n'aka ụlọọrụ 'Death Penalty Information Center' sị n'ime mmadụ 78 a marala ikpe ọnwụ n'afọ 1988 ruo 2018 na ọ bụ naanị mmadụ atọ ka e gburula.

Ugbua e nwere mmadụ 68 nọ n'ikpe ọnwụ na-eche mgbe a ga-egbu ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: