Lee mịnịsta nya ịnyịnya igwe gaa ịmụ nwa n'ụlọọgwụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị na mba New Zealand ji ịnyịnya igwe nke Bekee kpọrọ 'bicycle' gaa ụlọọgwụ ịmụ nwa mbụ ya.

Julie Genter dị ime izu 42, kwuru na o ji ịnyịnya igwe ahụ gaa ka ime mewe ya ọfụma makana "enweghị ohere dị n'ime ụgbọala maka ndị na-akwado anyị".

O tinyere foto ya na enyi ya nwoke n'Instagram ka ha abụọ na-egoli "ọmarịcha ụtụtụ Sunde a".

Genter dị afọ 38, bụkwa minister na-enyere onye nke na-ahụ maka njem aka, bụ onye ama ama n'ikwado ịnya ịnyịnya igwe.

Genter ga-anara ezumike onye mụrụ nwa ọhụrụ ọnwa atọ, esonyela n'ọnụọgụgụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị mụrụ nwa ka ha nọ n'ọchịchị.

Akụkọ ga-amasị gị