Ugbọala Uber na-akwọ onwe ya gburu mmadụ na Amerịka

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Uber bụ ndị so na emepụta ugbọala na anya onwe ya ekwuola na ha akwụsila ntule ụgbọ na-anya onwe ya ka otu ụgbọala ha kụgbụrụ otu nwaanyị dị afọ 49 na-agbafe okporoụzọ n'obodo Tempe dị na Arizona.

Dịka akụkọ si were kwuo, ihe ọdachị a mere ka ụlọọrụ Uber kwụsị ntule ụgbọ na-anya onwe ya ahụ ha bidoro.

Onyeisi Uber bụ Dara Khosrowshahi kwuru na Twitter na ọnwụ ahụ bụ ihe 'oke obi mgbawa".

"Anyị na-eche maka ezinaụlọ ọ dachi metụtara ma anyị na ndị ụweọjịị na-arụkọrịta iji ghọta ka ihe siri mee."

Ihe mberede a abụghị sọ sọ Uber ka o metụtara, ọ ga emetụta mbọ a na-agba iji rụpụta ụgbọala na-agba onwe ya maka njem ọra mmadụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: