You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chelsea vs Liverpool: E zila Chelsea na ọ bụghị naanị chịngọm na-ere eze
Ndị Liverpool gosiri Chelsea na ha ka ga-akwụnwu ụgwọ isi ha dịka ha meriri ha na Stamford Bridge.
Liverpool asọghị anya na ha nọ na be Chelsea, wee bie ha aka n'ala ma nara ha pọịntị atọ wee lawa.
Goolu abụọ ha ji merie Chelsea si n'ụkwụ Sadio Mane na nkeji 50 nakwa 54.
Chelsea tara ahụhụ karịa Job nke akwụkwọ nsọ dịka Liverpool ekweghi ha kute ume ndụ, ọkachasị mgbe a chụpụrụ Andreas Christensen.
N'agbanyeghi na Chelsea mefuru nde paụnd narị abụọ iji zụta ndị ọgbabọọlụ ọhụrụ n'afọ ọhụrụ a, ọ zọpụtaghị ha.
Ọkachasị etu Kepa Arrizabalaga bụ oche goolu si wee na-agba ọnyụpa n'ọgbọegwuregwu.
Chelsea mechara nweta penariti, mana Jorginho gbanyere ya n'aka Alisson na-echere ndị Liverpool goolu.
Ka ọ dị ugbua, Chelsea ga-ezute Barnsley n'asọmpi Iko Carabao n'ụbọchị 23 nke ọnwa Septemba, tupu ha ezute West Brom n'ụbọchị 26.
Ebe Liverpool ga-ezute Lincoln City n'ụbọchị 24 nke ọnwa Septemba n'asọmpi Iko Carabao, tupu ha na Arsenal akwata ya n'ụbọchị 28.