Man United vs Crystal Palace: A dụpuola Man Utd ka blomblom

Ndị egwuregwu

Ebe foto si, PA Media

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Na-erughi otu afọ ha nyakasịrị Man Utd ka gwongworo ike ụwa gwụrụ, Crystal Palace emekwaala ya ọzọ.

Ndị Manchester United tiri okokoko dịka ndị Crystal Palace dọkasịrị ha n'Old Trafford, n'ihe bụ asọmpi mbụ ha na-agba n'afọ 2020/2021 a.

Ndọkasịrị a mere ndị Man Utd echeta ebewe dịka ha ji ọkpụ goolu atọ a sara otu merie ha n'ihu Sir Alex Ferguson bụ chịkọtaburu ha.

Wilfred Zaha ji ibu kara aka gbakaa neetị na nkeji 74 dịka igwe nnyocha Video Assistant Referee (VAR) kwuru na David De Gea akwụghị n'akara ya oge Jordan Ayew gbanyere ya penariti nke mbụ n'aka.

Nke a bụ tupu o mezuo ya goolu atọ nke ndị Crystal Palace na-enye na nkeji 85.

Donny Van de Beek zara aha nna ya ozugbo, na-erughi nkeji 15 ọ batara n'ihe bụ bọọlụ mbụ ọ na-agbara Man Utd na Premier League.

Andros Townsend bu ụzọ mepeere ndị Crystal Palace ahịa dịka ọ dọkara neetị na nkeji asaa e jiri bido bọọlụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Man Utd ga-ezute Luton Town n'asọmpi Iko Carabao n'ụbọchị 22 nke ọnwa Septemba a, tupu ha ezutekwa Brighton n'ụbọchị 26 nke Septemba.