Aston Villa vs Chelsea: Chelsea egosila Aston Villa OAU (Okenye Abụghị Ụmụaka)

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu Chelsea egosila na ha ka bụkwa ochie dike na-ịgba bọọlu dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie ndị Aston Villa.
Ka egwuregwu a bidoro, ndị Chelsea jichiri bọọlụ ahụ ọtụtụ mgbe ka a ga-asị na edere aha ha na ya bụ bọọlụ.
Kama na mbọ niile ya gbara ka ha nye ya bụ goolu amụtaghị mkpụrụ.
Ọ bụ na nkeji iri anọ na atọ ka ndị Aston Villa gosiri na "Ogbu oge nwere 'plans' " dịka Kortney Hause zịgara bọọlụ ozi n'ime netị ndị otu Chelsea.

Ebe foto si, Getty Images
Aston Villa ji otu ọkpụ goolu emerị ndị Chelsea dịka agbachara agba nke mbụ.
Na-agba nke abụọ ka ndị Chelsea gosiri na agadị nwaanyị anaghị aka nka n'egwu ọ mara agba dịka ha ji nkeji atọ were nye ndị Aston Villa goolu abụo.
Ọ bụ onye ewebatara bụ Christian Pulisic nyere goolụ nke mbụ ebe Olivier gbakasiri netị ndị Aston na nkeji iri isii na abụọ.
Chelsea ka bụkwa ndị nke anọ na Premier League ebe ndị Astọn Villa nọ n'ọnọdụ odi ndụ onwụ ka mma dịka ha ji "Point" ise aga ndị kpeazụ bụ Norwich.










