You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Manchester United vs Wolves: Otu abụọ a bụ nnọọ ezigbo di na nwunye
Otu egwuregwu bọọlụ Manchester United na Wolves dịzi ka ha abụ di na nwunye n'eziokwu.
Ha abụọ eneyghị goolu ọbụla oge ha zutere n'ọgbọ egwuregwu 'Old Trafford' n'uhuruchi Satọdee.
Ihe mere Man Utd na Wolves ji dị ka Ejima
- Tupu egwuregwu nke taa ha abụọ nwere akara 34.
- Ka egwuregwu taa gwụrụ, ha abụọ nwere akara 35.
- Naanị goolu anọ ka Man Utd ji kara Wolves na tebulu EPL.
- Man Utd bụ ndị nke isii ebe Wolves bụ ndị nke asaa na EPL ugbua.
- Oge otu abụọ a zutere n'ọnwa Ọgọst 2019, ha gbara 1-1.
- Mgbe ha zutere n'asọmpi FA n'abalị anọ nke ọnwa Janụwarị 2020, ha gbara 0-0.
- Man Utd jisi ike merie Wolves 1-0 mgbe ha zutere ọzọ n'iko FA n'abalị 15 nke ọnwa Janụwarị.
- Asọmpi nke taa bikwara 0-0.
- A ga-akpọzị ụkọchukwu ka ọ gbaa otu abụọ akwụkwọ?
Ọ bụrụ na Tottenham emerie Manchester City ụbọchị ụka, ha ga-awufere ma Manchester United ma Wolves.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: