You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Liverpool vs Norwich City: Anwụrụla Norwich pịgbuo ka agbụsị
Liverpool gosiri Norwich City ihe ha ji bụrụ ọkaibe na mba Yurope
Norwich wetara onwe ha ihe mgbu site n'inye onwe ha goolu nkeji 7 site n'aka Grant Hanley.
Nke a nyere Liverpool ikike ịgba ha ụjọ na-ahụ nke mere Mohamed Salah ji mezuoabụọ na nkeji 19.
Norwich nwetere ohere ole na ole ime Liverpool ihe mana ha ejighi ohere a kpọrọ ihe.
Liverpool dịka ndị ejighi ọchị malite asọmpi nke afọ a wụnyere ọgbụ goolu atọ site n'aka Virgil Van Dijk na nkeji 28.
Tupu otu ọkara agwụcha na nkeji 42, Divock Origi mezuru ọkpụ anọ chara acha.
Agbanyeghi etu ọnụọgụgụ goolu siri kwụrụ na agba nke mbụ, Norwich nyekwara ndị azụ Liverpool nsogbu n'agba nke abụọ ebe Emiliano Buendia kpịanyere Pukki bọọlụ ojiri dọkata otu ha ji chịa obele ọchị.
Ọkacha gbaa - Divock Origi (Liverpool)