Amaju Pinnick 'azọkarala nsị aboki' dịka ụlọikpe sị ka anwụchie ndị NFF?

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyeela iwu akpọrọ "Bench Warrant" na Bekee banyere ikpe metụtara onyeisi otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Amaju Pinnick na mmadụ anọ ọzọ.

Ọkaikpe Ijeoma Ojukwu nyere iwu a maka na ndị a abịaghị ụlọikpe ịzara ọnụ ha maka ịgbari ego ndị Nigerian Football Federation (NFF).

Ndị e nyere iwu ka anwụchie gụnyere odeakwụkwọ NFF bụ Sunusi Mohammed; osote onyeisi NFF nke mbụ bụ Seyi Akinwumi;

Ndị ọzọ bụ osote onyeisi nke abụọ bụ Shehu Dikko na onye ọzọ bụ Yusuff Fresh.

Mmadụ nille a kpọrọ aha abịaghị ụlọikpe n'ụbọchị Monde nke ọkaiwu na-ama ha ikpe bụ Celcius Ukpong ji sị ka anwụchie ha bụ nke ọkaikpe nyere ikike a.

Gọọmentị etiti site na ndị ọrụ ọtawaike na-ahụ maka iweghachị akụnaụba gọọmentị gbara ndị ọrụ NFF akwụkwọ n'ụlọikpe maka ịgbari ego dị nde dọla 8.4.

Ozi NFF zitere BBC na-akọwa na-ọkaikpe gụpụrụ Maazị Pinnick n'atụmatụ, ma kwukwa na NFF ewegarala arịrịọ ga-aka Ọkaikpe inke Naịjirịa ka o tinye ọnu n'okwu a, ọkachasị maka Pinnick na ndị ọzọ n'ọrụ ọha n'Ijipt.

Akụkọ ga-amasị gị: