You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Jersey ndị Super Eagles ị nwere ọ bụ nke ezigbo?
Ebee ka ndị mmadụ si na-azụta uwe bọọlụ ọhụrụ Naịjirịa n'agbanyeghị na ndị mepụtara ya bụ Nike ebidobeghị ire ya n'ahịa?
Ka a na-akwado ibido asọmpi iko mbaụwa nke 2018, ndị Nike kwuru na agaghị ebido ire ya ruo ọnwa Juun, mana nke a akwụsịghị ụfọdụ ndị mmadụ ịrụ nke bụ adịgboroja.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya na a ga-ebido ire ya bụ uwe maka na asọmpi a ga-ebido n'ụbọchị ole na ole.
Mana ọ dị ka ndị ọ 'kacha mkpa' agaala n'ihu ịzụta ya bụ uwe, ma zụta ya n'ọnụ ala, na-echeghị ka ndị Nike kwuru na ha ga-ere nke ha dọla iri na asatọ na ise ($85), bido ire ya.
Nyocha BBC Igbo mere, gosiri na ụfọdụ na-ere nke adịgboroja, na-ere ya ihe dịka puku naịra isii (N6000), ebe nke ezigbo ndị Nike na-ere ruru pụkụ naịra iri atọ na otu (N31,000).
Otu onye na-aza @hormoharkin na Twitter, kwuru na ọ ga-amasị ya inwe nke ezigbo, mana ọ zụtala nke adịgboroja.
Otu onye na-ere ya bụ adịgboroja gwara BBC na nke ya bụ '100% polyester'.
O kwukwara na nke ya bụ "nke yiri ezigbo, mana ọ bụ nke ọma ya".
Ndị nwere Jersey ọhụrụ.
Cheta na ndị Nike wepụtara nke ọhụrụ n'ọnwa Febụwarị.
Ndị otu na-ahụ maka nchịkọta egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ 'Naịjirịa Football Federation' (NFF), kwuru nso nso a na ndị na-achọ ịzụta uwe bọọlụ nke ezigbo bụ nke ndị Nike na-ere, eruola nde atọ (3 million).
N'izu gara aga, Colin Udoh wụbu onye na-agbasa ozi gbasara ndị Super Eagles kwuru na ndị Nike ga-ebido ire ya bụ uwe n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee a.
Lee ihe nkiri ụbọchị ndị Nike gosipụtara uwe ọhụrụ otu Naịjirịa.