Otu egwuregwu Naịjiria ga-ebido ọzụzụ ha n'ụbọchị 22 n'ọnwa Mee

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu Naịjiria bụ 'Super Eagles' tozuru ịsonye n'asọmpị iko mbaụwa ga-eme na Rọshịa n'ọnwa Juun ebidola nkwado asọmpị ahụ.
Akụkọ na-ekwu na ha ga-ebido ọzụzụ ha n'ụbọchị 22 nke Mee n'ọgbọ egwuregwu dị n'obodo Uyo, nke bụ isi obodo Akwa Ibom steeti.
E nyere ha rue ụbọchị 21 nke mee iji rute n'ọgbọ egwuregwu ahụ iji bido nkwado ha.
Ha nwekwara ụfọdụ asọmpị iji kwado dịka Amanju Pinnick na-ekwu na nke ha na mba Congo ga-aga n'ihụ agbanyeghị ọrịa Ebola na efee n'obodo ha.
Cheta na onye nkuzi otu ha Gernot Rohr akpọọla aha ndị ọgba bọọlụ 30 ga-esonye n'asọmpị iko mba ụwa a na Rọshịa.
Lee ebe otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ gosiri aha ndị ga-anọchite anya Naịjrịa n'elu soshal midia:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Akụkọ ga-amasị gị:








