You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Henry Onyekuru anarala ihe nrita na mba Belgium
Onye ọgba bọọlụ Supa Igụls a na-akpọ Henry Onyekuru abụrụla ọkacha agba bọọlụ na ndị n'etopute n'afọ 2017 nke pụtara, 'The Most Promising Player of the Year' n'ọnụ bekee.
A na-akpọ ntuliugo a, 'The Soulier' n'asụsụ French maọbụ 'Belgian Golden Shoe' na bekee.
A na-enye 'ọkacha agba bọọlụ' na nkewa mbụ ntunyeugo nke mba Belgium na mbido afọ ọbụla maka afọ gara aga.
Onyekuru ka na-ezu ike maka ahụ omerụrụ n'ikpere ya na Disemba afọ 2017.
Ndị ọzọ so ya rite ihe a bụ Hassan Bandé na Landry Dimata.
O nwetara ntuliaka 219, ebe Bandé nwetara 162, Dimata nwetekwa 128.
Ọ bụ ụlọọrụ ntaakụkọ a na-akpọ 'Het Laatste Nieuws' na-akwadọ emume ntunyeugo nke a.
Lee ebe ha na-ekele ya n'elu igwe okwu Twita: