O nwebeghi onye pụtara kwuo na ụmụnwaanyị anaghị egbu ọja - Oluomachukwu
Olumachukwu Odimegwu bụ nwada na-akụ ọtụtụ ngwaegwu dị iche iche, ọkachasị nke ndị Igbo kọwara etu mmasị ya n'ịkụ ngwaegwu ndị a si malite.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Odimegwu kwuru na ọ bụ mgbe ya na ụmụnne ya ka dị obere site na nkwado nne na nna ha.
"Nne na nna m bụ ndị egwu na-amasị.
"Ha so n'otu ndị na-abụ abụ na ukwe, ebe ahụ ka ha nọ kpebie na ụmụ ha ga-amụta ngwa egwu dị iche iche ma ha too," ka o kwuru.

Olumachukwu kwuru na ugbua na ọ na-akụ ngwaegwu dị iche iche gụnyere; ngedelegwu, ekwe, ,ichaka, udo, okpokoro tinyere guitar na piano.
"Ana m egwu ọja, na-akpọ ụbọ, na-akụ ngwaegwu Igbo dị iche iche dịka ngedelegwu, ekwe, ịchaka, udo, ọkpọkọrọ. Ana m akpọkwa 'guitar na piano'"
O kwuru na o were ya ihe dịka out afọ iji mụta etu e si akpọ ụbọaka na igbu ọja.
O kwuru na ọ naghị eme ya ihe ihere na nwaanyị dịka ya na-egbu ọja maka na ọ hụrụ o nwere mmasị n'ebe ngwaegwu ndị a nọ.
O kwuru na dịka ọ na-agụ akwụkwọ na Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Awka na ngalaba dọkịnta, na ọ chọrọ iji ngwaegwu ndị a gwọọ ndị na-arịa ọrịa ma ọ bụrụ na ọ gụchaa akwụkwọ ma bụrụ dọkịnta.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị ụmụnwoke na-egbu ọja dịka ọtụtụ ndị Igbo sin a e che ya, na e nwere ụfọdụ ụmụnwaanyị na-egbu ọja n'ala Igbo.
Kirie ihe o kwuru n'uju;





