O nwebeghi onye pụtara kwuo na ụmụnwaanyị anaghị egbu ọja - Oluomachukwu

Aha onyonyo, Onwebeghi onye pụtara kwuo na ụmụnwaanyị anaghị egbu ọja - Oluomachukwu Odimegwu
O nwebeghi onye pụtara kwuo na ụmụnwaanyị anaghị egbu ọja - Oluomachukwu

Olumachukwu Odimegwu bụ nwada na-akụ ọtụtụ ngwaegwu dị iche iche, ọkachasị nke ndị Igbo kọwara etu mmasị ya n'ịkụ ngwaegwu ndị a si malite.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Odimegwu kwuru na ọ bụ mgbe ya na ụmụnne ya ka dị obere site na nkwado nne na nna ha.

"Nne na nna m bụ ndị egwu na-amasị.

"Ha so n'otu ndị na-abụ abụ na ukwe, ebe ahụ ka ha nọ kpebie na ụmụ ha ga-amụta ngwa egwu dị iche iche ma ha too," ka o kwuru.

Oluomachukwu ka ọ na-akpọ ụbọaka.

Olumachukwu kwuru na ugbua na ọ na-akụ ngwaegwu dị iche iche gụnyere; ngedelegwu, ekwe, ,ichaka, udo, okpokoro tinyere guitar na piano.

"Ana m egwu ọja, na-akpọ ụbọ, na-akụ ngwaegwu Igbo dị iche iche dịka ngedelegwu, ekwe, ịchaka, udo, ọkpọkọrọ. Ana m akpọkwa 'guitar na piano'"

O kwuru na o were ya ihe dịka out afọ iji mụta etu e si akpọ ụbọaka na igbu ọja.

O kwuru na ọ naghị eme ya ihe ihere na nwaanyị dịka ya na-egbu ọja maka na ọ hụrụ o nwere mmasị n'ebe ngwaegwu ndị a nọ.

O kwuru na dịka ọ na-agụ akwụkwọ na Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Awka na ngalaba dọkịnta, na ọ chọrọ iji ngwaegwu ndị a gwọọ ndị na-arịa ọrịa ma ọ bụrụ na ọ gụchaa akwụkwọ ma bụrụ dọkịnta.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị ụmụnwoke na-egbu ọja dịka ọtụtụ ndị Igbo sin a e che ya, na e nwere ụfọdụ ụmụnwaanyị na-egbu ọja n'ala Igbo.

Kirie ihe o kwuru n'uju;

Mgbe Oluomachukwu na-akụ ndegelegwu.
Oluomachukwu na ụmụaka ọ na-akuziri egwu na-akụ ngwaegwu dị iche iche.