Ikogosi warm Spring: Mmiri ọnatarachi a dị n’Ekiti ọ na-agwọ ime isi ike n'ezie?
Ekiti steeti bụ steeti a ma ama na Naijiria ọkachasị n'agumakwụkwọ, dịka ọtụtụ ụmụamaala ha gụwara isi nke Bekee kpọrọ 'professor'.
Mana ihe kacha eme ka a na-anụ aha steeti ahụ na mbaụwa bụ mmiri osinachi ha a kpọrọ 'Ikogosi warm spring'.
Ikogosi bụ mmiri bụ ihe nribama pụrụ iche n'ụwa n'ihi na ọ bụ mmiri ebe mmiri dị ọkụ na nke juru oyi jekọtara mana o nweghị nke gbanwere ibe ya.

Nke ka nke bụ na ndị obodo Ikogosi-Ekiti nwere nkwenye na mmiri a na-agwọ ọria di iche iche nke gụnyere ịba, ogbomịrị na nwoke, maọbụ nwaanyị ime na-esiri ike.
Akụkọ mgbe oche kwuru na ọ bụ otu dinta bu Ogọụngo, chọpụtara mmiri a oge gboo, dịka onye ndugharị ndị njem nleta bụ Samuel Adewole si kọwaa.
Ọnọdụ amụtaghị nwa na Naijiria
N’agbanyeghị na Naijiria nwere oke ọmụmụ, e nwere pasentị iri atọ na otu (31%) di na nwaanyị ime na-esiri ike dịka nchọpụta nke ụlọmmụta Guttmacher Institute siri kwuo.
Ụfọdụ ndị mmadụ na-aga ụlọọgwụ ime In vitro fertilization (IVF) maka ya, ebe ndị ọzọ na-aga ụlọ ekpere maọbụ ụzọ omenala iji nweta nwa.
Lee ihe onyonyo a ka ị hụ ihe gbasara mmiri a n'uju:


