You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Timothy Ofoegbu: Ọ bụghị naanị ndị Igbo ka a na-akpagbu na Naịjirịa, a na-akpagbu ndị Awụsa
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Ebeg o si, Lagos
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Ebeg o si, Lagos
- Onye dere ya, Anthony Okwudei
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Ebeg o si, Lagos
Timothy Ofoegbu bụ onye ọnụ na-eru n’okwu mabụrụkwa onye na-akụziri ndị mmadụ etu e si ahazi ndụ nke Bekee kpọrọ ‘Life Coach’.
Na mkparịtaụka nke ya na BBC Igbo nwere na nsonso a, Ọ gbarụrụ ihu etu e siri tụọ onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu nga mkpụrụ ọka mana Rịọ ka ndị ọwụwa Anyanwụ were ya nwayọ.
Ọ rụtụrụ aka na ọ bụghị nanị ndị Igbo ka a na-akpagbu na Naijiria. Gee ya n’uju:
Otu onye ọnụ na-eru n’okwu mabụrụkwa onye na-akụziri ndị mmadụ etu e si ahazi ndụ nke Bekee kpọrọ ‘Life Coach’ b ụ Timothy Ofoegbu akpọkuola ndị Ọwụwa Anyanwụ ka ha welata obi na olu n'iti mkpu nnwereonwe ma chọọ ụzọ inwere site na nkwalite akụnaụba nke mpaghara ahụ.
Na mkparịtaụka nke ya na BBC Igbo nwere na nsonso a, Ofoegbu rụtụrụ aka na ọ bụghị naanị ndị Igbo ka a na-akpagbu na Naijiria, na a nakpakwa ndị Awụsa.
"Ọ bụ eziokwu na a na-akpagbu anyị, ekwetara m."
Mana ọ bụghị naanị anyị ka a na-akpagbu. O nwere ndị ọzọ a na-akpagbu.
Achọrọ m ka onye ọbụla bụ onye Igbo nyocha ihe m na-ekwu:Onye Awụsa achịbeghị Naijiria."
O kwuru na ndị nile chịarala dịka Onyeisiala Naijiria kemgbe 1960 Naijiria nwere onwe ya, malite na Tafawa Balewa ruo na Tinubu, na o nwebeghị onye Awụsa chịrị.
N'okwu mkpọrọ a tụnyere onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu, Ofoegbu gbarụrụ ihu etu e siri tụọ Kanu nga mkpụrụ ọka mana rịọ ka ndị Ọwụwa Anyanwụ dere ji,ka e jiri nwayọọ dozie okwu ahụ.
Gee ya n’uju:
'Ndị zọọrọ anyị nnwereonwe tinyere ndị Igbo na nnukwu nsogbu
N'okwu ịzọta nnwereonwe, Ofoegbu kwru na ndị zọtarala ndị Igbo ị nnwereonwe tinyere Igbo na nnukwu nsogbu karịrị ha ha na-eti mkpu ya.
Cheta na Ojukwu duru Biafra nke mbụ, O rue n-agbata afọ 1990s, Ralph Uwazuruike, mee nke ya nke ọ gara mkpọrọ, ebe Nnamdi Kanu malitere nke ya n'agbata afọ 2000.
Ọ rụtụrụ aka ihe ndị fuorola ndị Owụwa Anya n'ihi iti mkpu nnwereonwe.
"Anyị na-eme ọfụma.n'agbata afọ 1960, Igbo nọ n'elu, a na-eghu anyị anyaọkụ."
"E bidohala nnwereonwe a, ihe nile anyị nwere lamila. Anyị bidokwa n'isi."
Ọ kpọrọ ndị Ọwụwa-Anya si ụzọ nkwalite akụnaụba chọwa nnwereonwe, ma hapụ tigbuo-zọgbuo.