You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị Gọvanọ chọọ ịchụ ndị omekome ọsọ, ha ma ihe ha kwesịrị ime - Sullivan Chime
- Onye dere ya, Michael Ngene, Ebere Ekeopara, Gift Ufuoma na Donald Wogu
- Ebeg o si, BBC Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
N'ime afọ ole na ole gara aga, ọnọdụ nchekwa na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa kụrụ afọ n'ala.
Kwa izuụka ọbụla, a na-anụ akụkọ ogbugbu, ntọrị, mwakpo na ọtụtụ mpụ ndị ọzọ dị iche iche mere na mpaghara ahụ.
N'agbenyeghị ọtụtụ mbọ ndị nọ n'ọchịchị na-agba iji weta ezi nchekwa na mpaghara ahụ, ọ dịka mbọ ha anaghị amịta mkpụrụ ọbụla.
Na mkparịtaụka Sullivan Chime bụbu Gọvanọ Enugwu steeti na BBC News Igbo nwere, ọ kọwara usoro dị iche iche e nwereike isi chụọ ajọ ọnọdụ nchekwa ọsọ ụkwụ eru ala na steeti niile dị n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
O nyekwara ndị Gọvanọ ise dị n'ọwụwa anyanwụ ndụmọdụ ma kwuo ihe bụ uche ya banyere oku ụfọdụ na-akpọ maka ntọhapụ Nnamdi Kanu nakwa oku a na-akpọ ka a kpọlata Simon Ekpa a nwụchiri na mba Finland ma kpee ya ikpe na Naịjirịa.