Akwụkwọ ndị ị kwesịrị inwe ka a ghara ịgbara gị ụgbọ nwamkpị site na mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images
Opeketampe ihe karịrị ụmụafọ Naịjirịa na-enweghi akwụkwọ zuru oke ibi n amba Amerịka nọ n'ihe izendụ ị chụlata ha site n amba ahụ.
Nke a bụ dịka ụlọọrụ mgbasaozi si kwuo na otu akwụkwọ ozi ụlọọrụ Fox News nwetere site n'aka ụlọọrụ na-ahụ maka ịbata na amba Amerịka a kpọrọ 'Immigration and Customs Enforcement and Removal Operations' (ICE).
Ụlọọrụ mgbasaozi Fox News wepụtara akụkọ na Tuzde 28 Jenụwarị 2025 ma kwuo na aha ọtụtụ ụmụafọ Naịjịrịa nọ n'Amerịka dị n'akwụkwọ ụlọọrụ ICE na-echezi iwu nke ikpeazụ ka e wepụ ha kamgbe ọnwa Nọvemba 2024.
Akụkọ ahụ kwuru na ụmụafọ Naịjirịa bụ ndị abụọ n'Afrịka kachasị n'ọnụọgụgụ ndị a chọrọ ịchụlata, ndị na-esote gụnyere Somalia, Ghana, Senegal na ndị ọzọ.
Kamgbe Onyeisiala Donald Trump weere ọkwa ọchịchị n'ụbọchị 20 Jenụwarị, amalitela ọrụ ịchụlata ọtụtụ ụmụafọ mba ọzọ bi n'obodo dị iche iche n'Amerịka.
A nwuchiri mmadụ ruru 956 n'ụbọchị Sọnde 27 Jenụwarị site n'ọrụ atụmatụ ịchụlata ndị mmadụ. Nke a na-eso nwuchi mmadụ 286 n'ụbọchị Satọde, mmadụ 539 na Fraịde nakwa mmadụ 538 n'ụbọchị Tọzde.
N'ọnwa Nọvemba 2024, aha ndị mmadụ karịrị otu nde nọ n'akwụkwọ ụlọọrụ na-ahụ maka ịbata n'Amerịka na-echezi ka e nye iwu ikpeazụ ga-ewepụ ha.
Ọbaozi websaịt ahụ kwuru n'etiti afọ 2023 na 2024, ọtụtụ puku ụmụafọ Afrịka banyere na mba Amerịka n'ụzọ iwu na-akwadoghi site na mpaghara Nicaragua.
Ụgbọelu mbụ bu ndị a chụlatara site na mba Amerịka akwụkwọ ha na-ezughi ezu adaala na mba Guatemala na Mexico.
Akwụkwọ ndị dị mkpa ị ga-enwe iji nweeike gaa n'ihu biri n'Amerịka dịka onye mbịarambịa

Ebe foto si, USCIS website
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Otu atụmatụ gbara ọkpụrụkpụ n'ọchịchị Trump bụ ịchụpụ ndị e sighị n'ụzọ ziri ezi bata Amerịka tinyere nkwa o kwere "ịchụ ndị mmadụ n'igwe".
Iji gaa n'ihu biri n'Amerịka dịka onye mbịarambịa, ị ga-enwe akwụkwọ ndịa gụnyere paspọt iwu kwadoro, visa dabara n'ebumnobi i ji bata (ọrụ, ezinaụlọ, ọsọ ndụ), ihe na-egosi ihe jikọtara gị na nwaafọ Amerịka maọbụ onye nkwado (ọ bụrụ na ọ kwesịrị), dabere n'ụdị visa gị.
Akwụkwọ ndị ọzọ dịka ọrụ e nyere gị, asambodo ọmụmụ, asambodo alụmdi na nwunye, ihe ndekọ ọnọdụ ahụike nakwa ihe ndekọ gbasara ego ole i nwere iji gosi ikikere i nwere ilekọta onwe gị anya na mba Amerịka.
Akwụkwọ ndị dị ezigbo mkpa maka ọnọdụ njem dị iche iche
Maka ibiri na mba ahụ kpamkpam (Green Card)
Amerịka na-enye ndị nwere mkpebi ibiri na mba ahụ kpamkpam akwụkwọ Permanent Resident Card dịka ihe na-egosi na ha nwere ikikere ibi n'Amerịka. Ụfọdụ mmadụ na-akpọ ya Green Card.
Iji nweta Green Card, i kwesịrị inwe ihe ndị a:
- Paspọt iwu kwadoro
- Akwụkwọ a kpọrọ immigration visa
- Akwụkwọ a kpọro Form 1-551 (Green card)
- ikike na-egosi ihe jikọtara gị na nwaafọ Amerịka maọbụ na iwu kwadoro gị ibi na mba ahụ kpamkpam (ọ bụrụ na ọ kwesịri)
Maka ndị batara n'ihi ohere ọrụ
- Akwụkwọ 'Form I-766', nke na-egosi ikike e ji were gị n'ọrụ
- Akwụkwọ leta si n'aka onye Amerịka nyere gị ọrụ
- Akwụkwọ 'Form I-140 (Immigrant Petition for Alien Worker)'
- Asambodo 'Labour Certification' (ọ bụrụ na a chọrọ ya)
Maka ndị batara n'ihi ezinaụlọ
- Akwụkwọ 'Form I-130 (Petition for Alien Relative)'
- Asambodo ọmụmụ 'Birth certificate' ndị ezinaụlọ gị
- Asambodo alụmdi na nwunye (ọ bụrụ na ọ kwesịrị)
Maka visa ndị agaghị anọte aka
- Paspọt iwu kwadoro
- Visa dabara n'ihe ị chọrọ (ịmaatụ., nlereanya, azụmahịa, agụmakwụkwọ, ọrụ)
- Akwụkwọ ndị kwadoro ya (ịmaatụ, leta nnabata sitere n'ụlọakwụkwọ ị chọrọ ịga maka visa nwataakwụkwọ).








