You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Casmir Chinedu Luke: Etu aka si kpara nwamadi a maka ebubo igwu gọọmentị Amerịka chadum ijeri dọla asaa
Ndị nnyocha gọọmentị etiti mba Amerịka anwụchiela otu nwafọ Naijiria aha ya bụ Casmir Chinedu Luke maka igwu ngalaba na-ahụ maka ndị agha lara ezumike nka chadum ego dị ijeri dọla asaa ($7m).
A nwụchiri Chinedu gbara afọ 66, bụ onye nwe ụlọọrụ na-elekwa ndị kara nka nakwa ndị ahụ adịghị n'ụlọ ha a kpọrọ 'Four Corner Health LLC' dị na Fresno dị na California, n'ọdọụgbọelu 'San Francisco International Airport' dika ọ na-achọ ibanye ụgbọelu na-abịa Naijiria.
Ngalaba na-ahụ maka ikpe nke mba Amerịka gbara ama na websait ha na Luke napụrụ ngalaba na-ahụ maka ndị agha lara ezumike nka (Department of Veterans Affairs-DA) ijeri dola asaa ahụ dịka ụgwọ maka ilekọta ndị kara nka ọbụladị izu kwulu izu ndị ahụ ụlọọrụ ya na-elekọta nwụchara.
E boro ebubo na Luke ji akara ụlọọrụ 'Four Corners' zigara ngalaba DA akwụkwọ ma nara ego n'aha mmadụ 10,000 maka ụgwọ nlekọta o nyere, ụfọdụ bụ ihe a gwụbuorola ya ụgwo, ụfodụ nke ụbọchị ndị ọrụ ya agaghị leta onye ha kwesịrị ileta nakwa nke ndị ọ sị na ụlọrụ ya lekọtara bụ ndị nwụọrọlarị.
Ọ bụrụ na a maa ya ikpe, Osuagwu ka anọ na ụlọmkpọrọ afọ 10 maọbụ a daa ya nha Puku nari abụọ na iri ise( $250,000).
Nke a abụghị mbụ bụ Maazị Luke bụ onye na-aza aha dị iche iche gụnyere Casmir Chinedu Osuagwu na-adabanye na mmiri ọkụ.
N'afọ 2010, a tụrụ ya mkpọrọ afọ atọ (ọnwa iri abụọ na asaa) maka igbalị ịkpụ akwụkwọ njirimara onye adịgboroja abụọ.
Otu bụ nke aha nwa ya nwoke gbalie ịkpụ akwụkwọ njirimara(passort) , nke ọzọ bụ aha nakwa akara onye ọ na-elekọta nwụrụ anwụ.