Chris Oyakhilome: Ụkọchukwu Naịjiria na-ebu agha megide ọgwụ mgbochi ọrịa ịba

Ebe foto si, Pastor Chris Online
- Onye dere ya, By Chiagozie Nwonwu, Fauziyya Tukur, and Olaronke Alo
- Ndị mere akụkọ a, BBC Global Disinformation Team
Pastọ Chris Oyakhilome onye yi uwe e ji mara ya, lere anya n'igwe fọtọ wee kwupụta na "e nweghị ihe akaebe na ọgwụ mgbochi na-arụ ọrụ".
N'okwuchukwu ya ọ gbasara na YouTube n'onwa February, Oyakhilome kwuru na “a ghaalare onye ọbụla ụgha gbasara ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa."
A maara ya dị ka "Pastor Chris". Ọ gbara afọ iri isii ma bụrụ otu n'ime ndị nkwusa ozi ọma a kacha mara n'mba Afrịka.
Nyocha ọtụtụ okwuchukwu ya BBC mere site na n'afọ 2023 na 2024, chọpụtara na ọ na-agbasa ozi mgbochi nye ndị na-eso ụzọ ya nke gbadoro ụkwụ n'ọgwụ mgbochi ọrịa ịba ọhụrụ a na-ekesa na mba Afrịka.
Ọrịa ịba bụ nnukwu nsogbu n'Afrịka. Ihe ruru pasent 95% nke ọnwụ metụtara ọrịa ịba mere na kọntinent Afrịka n'afọ 2022. Otu mbaụwa na-ahụ maka ahụike bụ WHO, kwuru na ụmụaka na-erubeghị afọ ise pasent 80% anwụọla site n'ọrịa ịba.
N'ime ọnwa isii gara aga, ụlọ ọrụ Pastọ Oyakhilome ewepụtala opekatampe akwụkwọ akụkọ ise gbasara ịbu agha megide ọgwụ mgbochi ọrịa nke ọ kesara n'ụlọ ụka, gbalarị iwu ụlọọrụ na-ebu agha megide agha ogwu mgbochi.
'Ebubo maka mbibi ụwa'
Nkwuputa maka ọgwụ mgbochi ọrịa ịba n'afọ gara aga ka ọtụtụ iri afọ gara - bụ nke ndị ọkachamara toro dị ka nnukwu mmezu nke nwere ike ịzọpụta ọtụtụ iri puku mmadụ.
Dị ka ụlọ ọrụ UN na-ahụ maka ụmụaka bụ Unicef si kwuo, ozi gbasara ịgba ọgwụ mgbochi na-aga kemgbe 2019 na Kenya, Ghana na Malawi, belatara ọnwụ ụmụaka ruo pasent 13%.
Mana ndị ọkachamara ahụike na-atụ egwu okwuchukwu onye pastọ Chris nwere ike imetụta nnabata ọgwụ mgbochi n'Afrịka.
N'ọnwa August afọ gara aga, pastọ Chris dọrọ aka ná ntị maka ọgwụ mgbochi nke ọ kpọrọ "Atụmatụ ihe."
O gbasara ozi dị iche iche na-ewu ewu nke kwuru na na ọgwụ mgbochi bụ ụzọ isi "mebie ụwa".
Ọ kwuru na ọ bụ ụgha na "ọrịa ịba anaghị ebute nsogbu n'mba Afrịka".

Ebe foto si, Reuters
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
"I gbasaa ozi ugha banyere ọgwụ mgbochi, karịsịa site n'aka ndị a ma ama dị ka ndị ndú okpukperechi, nwere ike ịnweta mgbagwoju anya dị iche iche ma mee ka ụfọdụ ndị mmadụ ghara igba ọgwụ mgbochi.
Otu onye na-ekwuchitere WHO kwuru na "Nke a nwere ike ịkpata nnukwu nsogbu maka ahụike ọha, ọkachasị na mpaghara WHO mba Afrịka ebe ọrịa ndị ọgwụ mgbochi na-egbochi na-emekarị".
Okwu pastọ Oyakhilome gụnyere dịka otu n'ime akụkọ ụgha a ga-elebere anya tupu a na-ewepụta ọgwụ mgbochi ọrịa ịba dịka akụkọ sitere n'aka ndị Africa Infodemic Response Alliance na-akwado WHO si kwuo n'ọnwa ma.
Anyị jụrụ pastọ ahụ ihe o kwuru megide ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa site na ozi e-mail nke ụlọ ọrụ ya na nke ụka, mana anyị enwetaghị nzaghachi.
Ọ tọrọ ntọala ụlọ ụka Christ Embassy na Lagos nke dị na Naijiria n'afọ 1990 wee gaa n'ihu chịkọta ọtụtụ narị puku ndị na-eso ụzọ n'ụwa gba gburugburu.
N'afọ 2011, e gosiri ya na magazin Forbes dị ka otu n'ime ndị pastọ kacha baa ọgaranya nke Naijiria ego ruru $30m ruo $50m (£24m ruo £40m).
Dị ka akwụkwọ akụkọ ahụ si kwuo, pastọ ahụ nwere mmasị dị iche iche na azụmahịa gụnyere akwụkwọ akụkọ, magazin, ụlọ ọrụ tv, I mepụta egwu, TV satellite, ụlọ oriri na ọṅụṅụ na ị rụpụta nnukwu ụlọ ebe obibi.
Ụlọ ọrụ ya aha ya bụ LoveWorld Inc, etoola kemgbe. Ugbu a, ọ na gbasaa ozi n'ikuku, ngwa izi ozi ya nwere ihe karịrị otu nde na ụlọ ahịa ngwa Google yana ụlọ akụ microfinance.
Otu ugboro n'izu uka, pastọ Oyakhilome na-ekwusa ozi ọma na nnukwu ogige ụlọ ụka dị na Asese, nke dị na okporo ụzọ Lagos-Ibadan.
Mgbe BBC gara n'ụlọụka ahụ n'ọnwa Nọvemba gara aga, ọtụtụ narị ndị ụkọchukwu si mba dị iche iche jupụtara n'ụlọ nzukọ ya maka ọgbakọ kwa afọ. E gosipụtara ọkọlọtọ nke ọtụtụ mba n'ime ya.
'Anyi kwesiri iti mkpu'
"Nnukwu nkuzi na-ọrụ ọgwụgwọ ọ na e mee n'ịntanetị", nwere ọnụ ọgụgụ zuru ụwa ọnụ nke "ijeri mmadụ asaa", dị ka webụsaịtị Christ Embassy si kwuo - nke a bụ ihe a na-atụghị anya ya n'ihi na ọnụ ọgụgụ ndị bi n'ụwa dị ijeri asatọ.
Winnifred Ikhianosin, dị afọ 25, bụ onye na-agachi ụka ahụ anya. Ọ gwara BBC na ọ jụrụ ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa.
Ọ kwuru na “Onye nke Chineke gwara anyị,”. "Emewokwa m nyocha nke m."
Dịka Ada Umenwariri, otu onye isi ụlọ ọrụ African Studies Centre na Mahadum North Carolina dị na Amerịka siri kwuo, pastọ Oyakhilome nwere "ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya".
Ọ gbakwụnyere, "Ndị pastọ na ndị isi okpukpereechi nwere nnukwu ike banyere ọchịchọ ọ na ihe ndị na-eso ụzọ ha na-eme."
Ọ kwuru na ịda ogbenye na enweghị akụrụngwa ahụike na Afrịka nwere ike ime ka ụka nwee ike ijide ndị mmadụ n'ihe gbasara ịgba ọgwụ mgbochi.
N'akwụkwọ akụkọ e bipụtara na saịtị akụkọ Nigeria, a kpọrọ 'The Cable', n'afọ gara aga, onye edemede Julius Ogunro, onye gara ụlọ ụka pastọ Chris ihe karịrị afọ iri, kwuru, sị: "Anyị kwesịrị iti mkpu ugbu a. Atumatu [nke] pastọ Chris na-akwalite bụ ihe dị njo nke na enweghịkwa ihe jikọrọ ya na okwukwe Ndị Kraịst."
Otú aha Pastọ Oyakhilome na-akpọ ọtụtụ ugboro bụ Bill Gates. Nwaamadi Billionaire ahụ bụ otu n'ime ndị na-akwado ọgwụ mgbochi ọrịa ịba, mana ọ nọkwa na-eche echiche maka ọgwụ mgbochi ọrịa kemgbe ọtụtụ afọ.
.

Ebe foto si, AFP
N'okwuchukwu ya n'ọnwa August 2023, onye ụkọchukwu gosiri ihe vidiyo sitere na okwu TED Bill Gates nyere n'afo 2010 dịka ọmụmaatụ nke "ndị nwere ebumnuche maka mbibi ụwa".
Mgbe ọ na-ekwu okwu maka ibelata ikuku carbon dioxide, Maazi Gates kwuru, sị: "Nke mbụ, anyị nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ. Ụwa taa nwere ijeri mmadụ 6.8. Nke ahụ na-aga ihe ruru ijeri itoolu. Ugbu a, ọ bụrụ na anyị arụ ọrụ dị ukwuu na ọgwụ mgbochi ọrịa ọhụrụ, nlekọta ahụike, ọrụ ahụike ịmụ nwa, anyị nwere ike belata nke ahụ ruo pasent 10 ma ọ bụ pasent 15%."
Pastọ Oyakhilome kpodoro nkwupụta ahụ isi n'ala. Enweghị mme ọ bụla Mazị Gates kwadoro maka mkpochapụ mmadụ n'ụwa.
Ọ kọwapụtala n'oge gara aga na ọ hụrụ mmụba nke ọnụ ọgụgụ mmadụ na mmụba ahụike: Ọ kwuru na "Mgbe ahụike na-akawanye mma, ezinụlọ agaaghị ị mụ ọtụtụ ụmụaka."
Mazị Oyakhilome kwukwara na ụlọ ọrụ World Mosquito Programme dị na Colombia bụ nke Gates Foundation, na-ebo ya ebubo na ọ na-emepụta anwụnta agbanwere mkpụrụ ndụ dịka atụmatụ maka mbibi ụwa.
Ụlọ ọrụ anwụnta ahụ bụ nke ehiwere iji belata ikike anwụnta ibunye nje, bụ nke otu ụlọ ọrụ obi ebere nke Mahadum Monash dị n'Australia. Ha kwụsịrị ike na ha anaghị emepụta anwụnta.
Pastọ Oyakhilome abụghị onye ọhụrụ na mgbasa ozi ị bụ agha megide ọgwụ mgbochi. N'oge na-adịbeghị anya, o lekwasịrị anya n'ọgwụ mgbochi 'papillomavirus human' (HPV), nke ezubere ichebe ụmụ nwanyị megide ọrịa cervical kansa.
N'ozi ọ kwupụtara na abalị abụọ onwa Septemba 2023, Pastọ Oyakhilome kwuru na "Ebumnobi ha dị iche. Ọ bụghị maka ọrịa kansa,"
Naijiria malitere mgbasa ozi ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa maka ụmụ agbọghọ n'ọnwa Ọktoba 2023 iji wedata oke ọnụ ọgụgụ ọrịa cervical kansa.
Ọrịa a na-egbu ihe karịrị ụmụnwaanyị 8,000 na Naịjirịa kwa afọ. N'afọ 2021, otu nnyocha siri ike nke Cancer Research UK kwadoro, chọpụtara na ọgwụ mgbochi HPV na-ebelata ọrịa cervical kansa ihe rụrụ pasent 90%.
N'oge gara aga, pastọ Oyakhilome kwuru ọtụtụ okwu na-enweghị isi gbasara ịgba ọgwụ mgbochi tetanus, ọgwụ mgbochi polio na ọgwụ mgbochi ụmụaka ndị ọzọ.
Pastọ ahụ kwuru okwu ụgha banyere ọgwụ mgbochi RNA nke ọ sịrị na ọ na-agbanwe DNA mmadụ.
Mana ọgwụ mgbochi ahụ anaghị agbanwe DNA mmadụ. Ọ na-enye aka ka ahụ mmadu lụso ọrịa ọgụ.
N'oge ọrịa Covid, a dara ụlọ ụka Pastọ Oyakhilome nha £125,000 ($155,000) site n'aka onye na-ahụ maka mgbasa ozi Britain Ofcom.
O kwuru na ụlọ ọrụ ya bụ Loveworld netwọk, nke na-agbasa ozi na UK, gosipụtara "nkwupụta na-eduhie eduhie na nke nwere ike imerụ mmadụ ahụ banyere ọrịa coronavirus na ọgwụ mgbochi".
Mazị Ogunro, bụ onye ode akwụkwọ hapụrụ ụka ahụ, kwuru na ihe pastọ ahụ na-eme na-echegbu ya ma na-enye ya nsogbu.
"Nkwupụta ya banyere ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa na-atụ m ụjọ. Anyị kwesịrị ịchọta ụzọ isi na-achịkwa ndị ụkọchukwu dị ka ya."









