Ndị Aku Okigwe arịọla gọọmenti Imo steeti ka ọ napụta ha n'aka 'Gentle'

Ebe foto si, Screenshot
Ọgbaaghara na-ada ugbua n'obodo Aku Okigwe dị n'Imo steeti n'ihi ihe onyonyo na-efegharị na soshal midịa, ebe "Gentle D Yahoo" na-eyi ndụ egwu.
"Gentle D Yahoo", onye ezigbo aha ya bụ Ifeanyichukwu Okorienta Eze bụ onye kpọrọ onwe ya onye nchịkọta otu agha ndị IPOB nke a kpọrọ Biafra Liberation Army (BLA), bụ ndị kwuru na ọrụ ha bụ inweta obodo Bịafra.
Mana kemgbe afọ ise gara aga, gọọmenti Etiti Naịjirịa, Gọọmenti Imo steeti, ndịagha na ndị uweojii ekwuola na ọ bụ ndị otu Gentle na eme ntọrị mmadụ, ire akụkụ ahụ, nakwa igbu mmadụ na-aga n'ihu ugbua na mpaghara Imo steeti ụfọdụ.
N'izuụka gara aga ka ya bụ onye omekome wepụtara ozi na "Facebook", ebe ọ nọrọ baara ndị Akụ Okigwe nnukwu mba.
Ozi ahụ na-eyi nnukwu egwu kwuru na ya onwe ya bụ "Gentle D Yahoo" ga-amalite ugbua gbuwe ndị Aku Okigwe n'ihi na ha gburu nwanne ya bụ Onowu, ma nọrọkwa n'elu ya na-atụnyere ndị otu ọrụ nchekwa gọọmenti aro gbasara etu ha ga-esi jide ya na ndị otu ya bi n'ime ọhịa.

O jiri nnukwu mba gwa ndị nche obodo nọ n'Aku Okigwe na ndị obodo niile na ya ga-egbu ha niile, ṅụọ ọbara ha ma gbaa ụlọ niile nọ n'Akụ Okigwe ọkụ.
O yiri egwu na ahịhịa ga-epu n'ụlọ ndị mmadụ.
Iyi egwu a mere ndị otu Aku Restoration Movement nke Maazị Ugochukwu Godwin Ikeh nọ n'isi ya jiri tie mkpu ka gọọmenti na ndị ọrụ nchekwa gbatara ha ọsọ enyemaka tupu Gentle ekpochapụ ha ma gbaa ụlọ ha ọkụ.
Ha dere n'ozi ahụ sị "Anyị bụ ndị obodo Aku nke dị n'okpuru ọchịchị Okigwe na-ekwu na Mazi Ifeanyi Okpegbuo Okorienta Eze bụ ya na ndị otu ya na-atọrị ndị mmadụ, na-ere akụkụ ahụ mmadụ, na-agba ụlọ ọkụ ma na-akpa arụ niile n'obodo anyị kemgbe afọ anọ."
"Anyị bụ ndị Aku na-agọnahụ ya, anyị na ya enweghị nkwekọrịta ọbụla, kama ọ bụ ekwensu na-ala ndụ n'iyi na-ekwu na ọ bụ nnwereonwe ka ọ na azọ."
Ozi ahụ gara n'ihu rịọ ndị ọrụ nchekwa na gọọmenti ka ha gbata ma zọpụta ha n'aka onye omekome ahụ tupu o mezuo okwu iyi egwu niile ahụ o kwuru.
"Anyị na-arịọ gọọmenti ka ha nyere anyị aka ruzie ihe ndị e ji enyere ndụ aka mebiri emebi ka anyị wee malitekwa ndụ n'uju ọzọ.
Aku enweghịzi ezigbo okporoụzọ, ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ, ebe ahịa anaghịzi azụ, tinyere ihe ndị ọzọ."

Ebe foto si, Screenshot
Obodo ndị e borola "Gentle D Yahoo" na ndị otu ya ebubo ịkpa ike ọjọọ gụnyere:
Orsu - Orsu Ihiteukwa, Eziawa.
Okigwe - Aku, Umulolo, Ihube, Nneato, Obinetiti, Arondizuogu, Umualumaku Ideato LGA.
Orlu - Umuaka, Amaifeke, Njaba, Awo-Omamma, Awo-Idemmili, Oru East nakwa Oru west.
Cheta na Gọọmenti Imo steeti nke Gọvanọ Hope Uzodimma nọ n'isi ya ekwela nkwa ọtụtụ oge inye onye ọbụla ga-achọta Gentle D Yahoo na ndị otu ya akatamkpo ego a kpọrọ "bounty", mana ọ mịtaghị mkpụrụ.
Gọọmenti Imo steeti nyekwara mgbaghara "amnesty" nke onye omekome ọbụla ga-ejiri aka ya were onwe ya nye gọọmenti, nke kwụsiri na July 2025, mana nke ahụ amịtaghịkwa ezi mkpụrụ.

Ebe foto si, Screenshot
Ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri ka otu onye so n'otu na-achọ nnwereonwe Biafra kpọrọ onwe ya Gentle Yahoo ma bụrụkwa onyendu otu kpọrọ onwe ha Biafra Liberation Army (BLA) ka ọ na-eyi egwu na ọ ga-egbusi mmadị niile nọ n'obodo Aku dị n'okpuruọchịchị Okigwe nke Imo Steeti.
N'ihe onyonyo ahụ, nwamadị a kwuru na iwe ya bụ maka na ndị obodo Aku kpara nkata ma gbuo nwanne ya nwoke ọ kpọrọ Onowu.
"Abatara m n'ala Aku o nweghi onye ọbụla m gburu mana ha kpaa nkata gbuo nwanne m Onowu. Aga m egbu onye ọbụla nwara m, gbuo ezinaụlọ ya ma raa ọbara ha."
Ọ gara yiri egwu na ọ ga-ememina otu onye ọ kpọrọ 'Edi Afaọnụ' na ka o chere aka ghọrọ ya.
Gentlye d'Yahoo gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị Aku kpọrọ ya oku, kwụọ ya ego dị otu nde naịra na puku narị abụọ (N1.2m) ka o nyere ha aka chụọ ndị ntọrị ọsọ.
Ihe onyonyo a kpalitere okwu dịka ọtụtụ mmadụ katọrọ ihe nwamadị a kwuru, ụfọdụ jụrụ etu otu onye ga-esi na-eyi obodo niile egwu.
Kedụ ihe butere okwu a?

Ebe foto si, Okigwe Forum
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'ụbọchị ole ma ole gara aga, n'ime ọnwa ọgọst afọ, 2025 ndịagha Naịjirịa na ndị nchekwa ọdịnala gbakọtara aka ọnụ wakpoo ogige ndị ojiegbe a sị bụ ndị otu BLA nọ n'ime ọhịa.
Ndị ojiegbe ahụ na ndịagha na ndị nchekwa ọdịnala kwarịkọtara mgbọ, nke butere ọnwụ ọtụtụ ndị ojiegbe ahụ.
Ihe onyonyo soshal midia gosikwara mgbw ndịagha na ndị nche ọdịnala na-achụ ndị ojiegbe ahụ ọsọ.
Ngwa ngwa nke a mechara ka Gentle d'Yahoo pụtara na soshal midia baa na ṅụọ iyi igbusi ndị obodo Aku maka ogbugbu nwanne ya nwoke bụ Onowu.
Otu onye si na mpaghara obodo ahụ bụ Chukwuka Ofoegbu e ji 'Ijele Speaks' mara kọọrọ BBC Igbo etu nsogbu Aku na Gentle d'Yahoo siri malite.
O kwuru na Gentle so na ndị ji aha ọchịchọ nnwereonwe Biafra na-akpa ike ma na-egbusi ndị mmadụ na mpaghara Orsu na Awo Idemmili bụ ndị ji olulu a kpọrọ 'mother valley' mere ogige ha.
Ọ sị na e ruru ihe dịka afọ 2021/2022 mgbe a chụrụ ha ọsọ n'ogige ahụ ka ọ lọtara n'obodo ya bụ Aku sị ka o nyere ha aka chụpụ ndị ntọrị n'obodo ha.
Ndị obodo Aku nabatara nke a na mbụ mana Gentle na ndị otu malitere ime mpụ dị iche iche n'obodo Aku, nke gụnyere igbu ndị mmadụ, izu ohi, ịtọrọ mmadụ nakwa ịla ụlọọrụ ọbụla gọọmenti nwe n'iyi.
Nke a mere ka ọtụtụ ndị obodo Aku jiri gbapụ ọsọ n'obodo ha ebe ụfọdụ obi kara jiri na-ebuso ya na ndị otu ya agha.
Ijele gara n'ihu kwuo na nwanne ya nwoke bụ Onowu ọ sị na e gburu, na aka ya adịghị ọcha, na o so n'ime ndị na-eyi obodo Aku na mpaghara Okigwe egwu.
Otu onye ọzọ bụ onye obodo Aku kwuru na ihe na-eme n'obodo ha metụtara ya nke ukwuu maka na Gentle na ndị otu ya gburu ụlọ ya abụọ ọkụ n'ihi na ọ katọrọ ihe ndị ọ na-eme.
O kwuru na nwamadị a na ndị otu ya egbuola ọtụtụ mmadụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ n'Aku na mpaghara Okigwe ndị ọzọ.
Ugbua ndị obodo Aku na mpaghara Okigwe ndị ọzọ ewepụtala ozi na ha na-achọ Gentle na osote ya bụ Onyedikachi Isaiah e ji Angel Makeup mara achọ.
Ha sị na onye ọbụla gbara ama ebe ha nọ ga-enwete ego onyinye nde naịra iri (N10m).
Ihe ndị ọrụ nchekwa kwuru
Ndị uweojii Imo Steeti ekwubeghi ihe ọbụla banyere ihe onyonyo a Gentle d'Yahoo mere mgbe ọ na-eyi egwu igbusi ndị obodo Aku.
BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ha bụ Henry Okoye mana ọ zaghị oku ekwentị na ozi e zigaara ya tupu akụkọ a apụta.
N'aka nke ọzọ, gọọmenti Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steeti nyere ndị ojiegbe a niile n'Imo steeti ohere ịwụsa ngwa ọgụ ma nata mgbaghara a kpọrọ 'Amnesty'.
Onye bụ Gentle d'Yahoo?
- Ọ bụ nwafọ obodo Aku dị n'okpuruọchịchị Okigwe nke Imo Steeti
- Ezigbo aha ya bụ Ifeanyichukwu Okorienta Eze mana e ji "Gentle d'Yahoo" maara ya.
- Ọ bụ onye ọgbatumtum n'Okigwe tupu o sonye ndị otu na-achọ nnwereonwe Biafra.
- Ọ bụ otu n'ime ndị na-eso ụzọ Ikonso e gburu egbu, ọ bụ ya na-ebu ọkọlọtọ Biafra n'otu ahụ.
- Akụkọ kwuru na ọ lụrụ ụmụnwaanyị atọ n'obodo Orsu, nakwa n'Umunze.
Kamgbe ihe dịka afọ anọ ka e bidoro na-anụ aha Gentle maka ọtụtụ mwakpo ya ndị otu ya na-eme na gburu gburu Imo steeti.
Ndịagha kwuru na mwakpo Gentle na ndị otu BLA mere gụnyere; ogbugbu nwata nwaanyi onye agha na di ya bụkwa onye agha n'Orlu Imo steeti n'afọ 2023, ogbugbu nwata nwanyi onyeagha si ọzụzụ NDA lọta n'Ihube Imo steeti, ogbugbu ndị uweojii abụọ ma gbaa ụgbọala ha ọkụ n'ụzọ awarawa Okigwe gawa Aba na ọtụtụ ndị ọzọ.
Ka ọ dị ugbua ọtụtụ ndị obodo Aku, Umulolo, Ihube, Obinetiti na Arondizuogu esila n'obodo ha gbaa ọsọndụ.









