Ihe anyị ma maka nwaanyị a manyere ka ọ ṅụọ mmiri e ji saa ozu di ya n'Imo Steeti

Kọmịshịọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ọdịmma obodo bụ Nkechinyere Ugwu, nwaanyị di nwụrụ bụ Chika Ndubuisi na ndị ọzọ.

Ebe foto si, Imo State Gov/ Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Obodo a na-akpọ Awo-Omamma dị n'okpuru ọchịchị Oru dị n'Imo Steeti abụrụla ebe a kpụ n'ọnụ ugbua maka ezinaụlọ manyere nwaanyị ka ọ nụọ mmiri e jiri saa ozu di ya ahụ.

Aha nwaanyị e mere ihe ahụ bụ Chika Ndubuisi bụ onye di ya nwụrụ anwụ.

Ezinaụlọ di ya jidere ya, bo ya ebubo ma manye ya ka ọ nụọ mmiri e jiri saa ozu di ya ahụ iji gosi na aka ya dị ọcha banyere ọnwụ di ya.

Mgbe nke a na-eme ka akpọtụrụ gọọmenti Imo steeti site na Mịnịstịrị na-ahụ maka ụmụnwaanyị bụ ndị gbagara ma zọpụta nwaanyị ahụ.

Ihe gọọmenti Imo steeti kwuru

Gọọmenti Imo steeti site n'ọnụ kọmịshịọna na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ọdịmma obodo bụ Nkechinyere Ugwu katọrọ ihe mere dịka ha zọpụtachara nwaanyị ahụ bụ (Chika Ndubuisi).

N'akwụkwọ ozi ha wepụtara ka ha kọwara ihe ezinaụlọ ahụ mere Chika Ndubuisi dịka ihe jogburu udele na njọ ma sigbuo nkakwụ na-esi.

Ha sị na "nke a bụ ajọ ihe. Ọ bụ ihe megidere iwu obodo ma bụrụ ihe adịghị mma ntị ịnụ n'ụwa ebe mepere emepe".

Gịnị ka a ga-eme ndị mere Chika Ndubuisi ihe a?

Kọmịshịọna Nkechinyere Ugwu kwuru n'akwụkwọ ozi ụlọọrụ ya wepụtara na ndị ahụ megidere nwaanyị di ya nwụrụ anwụ ga-emechaa mara na e nwere iwu na-achị obodo.

Ọ sị na "ndị ahụ ga-eje ụlọikpe zara ọnụ ha".

Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmenti Imo steeti nwere mmasị nchekwa ikike na ugwu dịara ụmụnwaanyị na steeti ahụ.

Ọnọdụ Chika Ndubuisi ugbua

Mịnịstrị na-ahụ maka ụmụnwaanyị na ọdịmma obodo n'Imo steeti kwuru na ọ bụ eziokwuna nwaada Chika Ndubuisi nọ n'ụlọọgwụ ugbua .

O kwuru na nwaanyị ahụ nọkwa n'ebe a ga-enye mgbamume nakwa kwado ahụike ụbụrụ ya nke ndị bekee kpọrọ 'psychosocial support'.

Ha sị na dịka nke a na-eme na ndị uweojii ebidola ime nnyocha banyere ihe mere.

O nwere iwu megidere ihe e mere nwaanyị a?

Ọkaiwu a maama n'Enugwu steeti ma bụrụkwa onye zọbụrụ ọkwa Gọvanọ bụ Nnenna Anozie ekwuola na ndị ahụ manyere Chika Ndubuisi maọbụ soro kpaa nkata ka ọ nụọ mmiri e ji saa ozu di ya ahụ dara iwu.

Anozie kọwara na iwu a na-akpọ 'Violence against persons prohibition Law (VAPP-Law) kọwapụtara ntarama ahụhụ dịrị ndị mere ihe ahụ.

O kwukwara na iwu Naịjirịa nke ngalaba na-ekwu maka ikike dịrị mmadụ megidere mmadụ ikpagbu ibe ya.

Dịka o si dị ugbua "ndị mere ihe ahụ nwereike ije nga ruru afọ ise maọbụ kwụọ ụgwọ dịka ntaramaahụhụ".

VAPP-Law na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa

Nnenna Anozie kwuru na VAPP-Law bu iwu e wepụtara na Naịjirịa n'afọ 2015 n'ọchịchị Goodluck Jonathan.

"Iwu ahụ bụ iwu machiri ọtụtụ mkpagbu a na-enye ụmụnwaanyị nke gụnyere mkpagbu a na-eme kpọọ ya omenaala maọbụ ọdịnaala".

"Ime ka nwaanyị nụọ mmiri e ji saa ozu ahụ so na ihe iwu ahụ machiri makana ị tulee ya, ị ga-amara na mmiri ahụ bụ ajọ mmiri asapụtara n'ozu e ji ọtụtụ ihe nwereike igbu mmadụ chekwaa".

"Mara na mkpagbu ahụ VAPP-Law machiri nwereike ịbụ ihe dịka iti ihe, ịnapụ mmadụ ụzọ o si eri nri, ịnapụ ya ọnatarachi ya maọbụ ịma nwaanyị elu n'ike na ihe ndị ọzọ".

Anozie gara n'ihu kọwaa na gọọmenti niile dị na ndịda ọwụwa anyanwụ emeela ka VAPP-Law bụrụ iwu na steeti ha.

Ọ kọwara na Anambra steeti mere ka VAPP-Law bụrụ iwu na steeti ahụ n'afọ 2017, Enugwu n'afọ 2019, Imo n'afọ 2021, Ebonyi n'afọ 2021 ebe Abịa mere ya iwu n'afọ 2020.