‘Egwuruegwu Invictus na-egosi m na ọ bụghị nanị m so’

Aha onyonyo, Dean Onwuchekwa bụ onye ji ọkwa lance corporal n’ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa.
‘Egwuruegwu Invictus na-egosi m na ọ bụghị nanị m so’
    • Onye dere ya, Okechukwu Omeire na Joshua Akinyemi , Makuochi Okafor, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalists, Reporter na Producer
    • Ebeg o si, Legọs

Dean Onwuchekwa bụ onye ji ọkwa lance corporal n’ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa. Ya na ndị otu ya na-akụnyụ ogbunigwe ndị Boko Haram tupu otu agbaa ya n’ihu.

O nwetara nnukwu ihe mmerụahụ site na nke ahụ dịka achapụrụ ya aka abụọ.

Ọ sooro maa aka n’asọmpi ndịagha nwere nkwarụ nke ụlọọrụ obi ebere Invictus Games Foundation na-ahazi.

Ụlọọrụ ahụ na-arọpụtara ndịagha nwetara nkwarụ site n’ọrụ ha ohere isoro maa aka n’ụdị egwuruegwu dị icheiche.