You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Osinachi's death: Lee ihe ụlọikpe kpebiri taa
Ụlọijkpe Ukwu dị n'Abuja akụpụla arịrịọ nke di otiegwu ụka a ma ana o nweghị ihe o nwere ịza n'ebubo na aka ya dị n'ọnwụ nwunye ya.
A na-ekpe Peter Nwachukwu ikpe maka ebubo na aka ya dị n'ọnwụ nwunye ya bụ otiegwu ụka Osinachukwu Nwachukwu bụ onye nwụrụ n'abalị asatọ nke ọnwa Eprelu afọ 2023, n'ihe e cheburu bụ kansa akpịrị tupu ndị ezinaụlọ ya tiwe mkpu banyere mkpagbu ọ gabigara n'aka di ya.
N'ikpe ya, ọkaikpe nọ n'isi ikpe ahụ bụ Jọstis Njideka Nwosu-Iheme kwuru na ndị wetara ikpe ahụ gosiri na Nwachukwu nwere okwu o kwesịrị zara ọnụya.
Maazi Nwachukwu sịrị na aka ya dị ọcha n'ebubo a na-ebo ya, ebe ọkaikpe nyere iwu ka etinye ya na mkpọrọ Kuje dịka ya bụ akwụkwọ nke Gọọmentị Etiti gbara ya na-aga n'ihu.
Na ya bụ ikpe, a kpọọla ndị akaebe 17 na ikpe ahụ malitere n'abalị 20 nke ọnwa Juun afọ 2022.
Cheta etu ọnwụ Osinachi si gaa:
Nnyocha ozu nke ụlọọgwụ 'National Hospital Abuja' mere kwuru na o nweghị apa gosiri na e tiri Osinachi ihe kama a hụrụ kansa n'obi ya, ngụ ya na akịrị ya,. A hụkwara ụkwụ na obi zara aza, nakwa mmiri na ngụ ya.
Ka a gbara mpụtara nnyọcha ahụ n'anwụ, Ọkaiuw wetara akwụkwọ ka akagbuo ikpe ahụ kpamkpam si na Nwachukwu enweghị okwu ọbụla dịka ihe akaebe ndị ọrụ ahụike kwuru ihe ha hụrụ.
Mana Okaikpe kụpụrụ arịịọ ahụ ,higharịa ikpe ahụ ma nye iwu ka e jichie Nwachukwu.