Etu e si tọrọ ụkọchukwu Katọlik n'Anambra steeti

Ụka Katọlik nke Achịdayọsis Ọnịcha ekwupụtala na ndị ntọ tọọrọ otu ụkọchukwu ha aha ya bụ Joseph Igweagu.

Ozi a si n'aka Prudentius Aroh, onye ụkọchukwu ji ọkwa 'Chancellor' na mpaghara ahụ.

Ọ kọwara na ụkọchukwu Joseph Igweagu gara kaa ụka akwamozu n'obodo Umunachi na mgbede ụbọchị Wenezde, abalị iri na abụọ nke Ọkụtoba, mana oge ọ na-alaghachi n'ụlọ ya ka ndị ekperima ahụ tọọrọ ya.

Fada Igweagu bụ onye na-elekọta ụlọụka St Joseph Parish, Abata, Nsugbe.

"Anyị na-arịọ ka onye ọbụla kpesie ekpere ike maka ntọhapụ ya n'aka ndị ntọ a ji ya," akwụkwọ ozi ahụ Fada Prudentius Aroh dere kwuru.

"Achịdayọsis Ọnịcha na-agba mbọ niile anyị nwere ike iji hụ na o nweere onwe ya."

Oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Toochukwu Ikenga, o kwuru na ya ga-ezighachitere anyị ozi.

Mana Ikenga mechara zite ozi ma kwuo na ndị uweojii anatabeghị mkpesa maka ya bụ akụkọ.