Etu m siri mụọ ụmụ ejima ise ka afọ 16 gachara - Chinyere Enendu

Aha onyonyo, Etu m siri mụọ ụmụ ejima ise ka afọ 16 gachara - Chinyere Enendu
Etu m siri mụọ ụmụ ejima ise ka afọ 16 gachara - Chinyere Enendu
Etu m siri mụọ ụmụ ejima ise ka afọ 16 gachara - Chinyere Enendu
    • Onye dere ya, Adline Okere
    • Ndị mere akụkọ a, Editor
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Chinyere Enendu na di ya mụtara ụmụ ejima ise dịka ọ gasịrị afọ iri na anọ nwa ha nke mbụ nwụrụ.

Oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, Odoziakụ Enendu kọwara na ụmụ ejima ahụ bịara oge ya enweghịzi olileanya ịtụrụ ime ọzọ.

Ọ sịrị na ya na di na gbara ọtụtụ mbọ dị iche iche iji hụ na ha mụtara nwa ọzọ, oge nwa ha nke mbụ nwụrụ mana o nweghị nke nwere isi.

O kwuru na ezinaụlọ di ya gbalịrị nke ukwuu site n'ụdị enyemaka dị iche iche, mana oge o chere na olileanya agwụla ka ya bịara tụrụ ime.

"Ụmụ a bịara mgbe m enweghị olileanya. Agwara m onwe m sị ma o mere ma o meghị, agbaala m mbọ".

"Anyị mere IVF ugboro itoolu. O nweghị nke bụ obere ego mana di m gara n'ihu. Ezinaụlọ di m gbalịrị site n'iwepụta ego iji hụ na mụ na di m dịka ndị ọzọ" ka ọ gwara anyị.

Chinyere Enendu kwuru na ya gbanarịrị ihe ọghọm n'oge ọmụmụ nwa n'ihi na ichi ụmụ ya gbawara n'ime afọ oge ha na-azọ ọnọdụ, nke mere o ji mụọ ha n'oge na-erughị eru.

O kwuru sị: "Dọkịta mere nnyocha nke ọma chọpụta na ụmụ ejima atọ m bu n'afọ kpọdoro isi n'ala na-azọ ọnọdụ, nke mere ka ichi ha gbawaa".

"Dọkịta nyochara ụda obi ha chọpụta na ha dị mma. Ọ sị na m agaghị ala, ka m nwee ike nọzuo oge."

Ndị dọkịta wara Odoziakụ Enendu afọ, kuputa ụmụ ejima ise ma tinye ha n'igwe okpomọkụ bụ 'incubator'.

Dịka o siri kwuo, ọ bụ naanị ihe dịka izuụka abụọ ka ụmụ ejima ahụ nọrọ n'ime igwe okpomọkụ tupu agwa ya na ọnọdụ ha adịla mma.

Ọ sịrị na ihe mere o ji dị etu ahụ bụ maka na ya gbasoro ntuziaka dọkịta nyere ka ọ na-agaru ụmụ ya nso ma na-ekwusara ha okwu.

"Dọkịta ụmụaka sịrị m "nne, ọ bụrụ na ị chọrọ ka ụmụ gị dị mma ngwangwa, ị ga-aga n'igwe okpomọkụ ka ha nụ olu gị, o nwere ihe jikọrọ nne na ụmụ ya. Ha na-anụ olu gị, ọ ga-eme ka ha dị mma ngwangwa," bụ ndụmọdụ ọ sị dọkịta nyere ya oge ọ nụchara nwa.

Pịa aka ebe a ka i soro Whatsapp Chanelụ anyị
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro Whatsapp Chanelụ anyị

Nne ụmụ ejima ise ahụ kwuru na nnukwu ọṅụ juru ya obi oge ọ hụrụ ụmụ ya anya nke mbụ.

"Oge e kubatara ha n'ime ụlọ ebe m nọ, m lee ha anya n'ihu, nnukwu ọṅụ juru m obi," ka Enendu kwuru.

Ọ kọwara na ọ dịghị mfe ilekọta ụmụ ise ahụ anya, ọkachasị dịka ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa siri dị ugbua, mana o kelere ezinaụlọ di ya nakwa ikwu na ibe maka enyemaka ha.

Ọ gwara ndị na-achọ nwa ka ha nwee ndidi ma tụkwasị Chineke obi, n'ihi na o nweghị ihe ọ na-apụghị ime.

Ka ọ dị ugbua, ụmụ ejima ise ahụ na-akwado ịbanye n'ọnwa nke asatọ ha, dịka ha gbasiri ike ma na-emekwa nke ọma.