You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Boko Haram: Etu mwakpo ha jiri zewe isi ọzọ na na mpaghara ugwu Naịjirịa
- Onye dere ya, Aisha Babangida
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
- Ebeg o si, BBC News, Abuja
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
N'ọnwa Septemba gara aga, ka ndị ndị otu na-eyi ọha egwu bụ Boko Haram wakpọrọ obodo Mafa dị na Yobe, dị n'ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Naịjiria, ọ weghachiri egwu nke oge ndị bi na ya chere na ọ ga-apụ. Mgbe ọdi ka nsogbu ha agwula, tupu ha emechie anya ha meghee ya ndị mwakpo ahụ egbuola ihe karịrị otu narị mmadụ.
Kedụ ndị bụ Boko Haram makwa ihe ha na-achọ? Boko Haram na-akwalite ụdị okpukperechi alakuba, nke anakpọ Islam nke mere ka ọ bụrụ ihe amachibidoro maka ndị Alakụba iso na ndọrọ ndọrọ ọchịchị maọbụ mmekọrịta ọha na eze ọbụla metụtara obodo ọdịda anyanwụ. N'ihi nke a ha gunyere Naịjiria na mba ndị na-ekwenyeghị na okpukperechi alakuba na achi n'agbanyeghị ma onyeisiala ọbu onye alakụba ma ọbughị
Mgbe ndi mmadụ chere na ndị agha Naijiria site na-enyemaka ndi obodo gbara ha gbụrụgbụrụ emeriela ndi na-eyi ọha egwu, mwakpo Boko Haram na Naịjirịa abawanyela nke ukwuu n'ime afọ atọ gara aga.
ị na-ele any na ihe nwepụta SBM Intelligence, otu nzukọ na-arụ ọrụ na mkpokọta ọgụgụ isi nchekwa mere, Mwakpo nke ndi Boko Haram mere n'ime afọ atọ gara aga na ọnụọgụgụ eruola ihe kariri 443; na afọ 2022 ha mere mwakpo rụrụ 105, afọ nke ọzọ bụ 2023 ha wakpọrọ ihe rụrụ 147Attacks dịka nke ha mere 191 na afọ 2024.
Na afọ 2025, mwakpo nke mbụ ha mere bụ na Jenụwarị 4, mgbe ha wakporo ndị agha Naijiria na Sabon Gari Village gbuo mmadụ isii. ụbọchị itolu mgbe e mesịrị nke bụ Jenụwarị 13, Boko Haram mere mkpa mkpa na Dumba Village nke nọ na-akụkụ Baga ma gbuo ndị ọkụ azụ̀ na ndị ọrụ ugbo ihe rụrụ mmadụ 40
Kedụ ka e si mara na ndị omekome ndị a amalitela mwakpo ha ọzọ?
N'ihi nke a Gọvanọ Borno steeti bụ Babagana Umara Zulum na Eprel 8, 2025 tịrị mkpu maka mbuso agha Boko Haram na ndị ịtọrọ mmadụ nke na-arị elu na steeti ya dịka ndị na-eyi ọha egwu na amalite ibuso agha nye ndị agha Naịjiria
Okwụrụ na "Ogbugbu e gburu ndị nkịtị na ndị ọrụ nchekwa bụ ihe na-atụ egwu ma na-egosi nnukwu ndọghachi azụ nye steeti Borno na mpaghara ugwu ọwụwa anyanwụ.
Aliyu Harande, nke bi na Mafa, otu n'ime obodo ndi Boko Haram mere mwakpo na Borno kwụrụ na "ihe anya ha hụrụ abughị obere ihe ike, ujọ na-atu onye ọbula"
Onye ọzọ tinyere ọnụ na okwu a bụ Zanna Umara onye ọrụ ọchịchị ime obodo Tarmuwa local gọọmenti, ọ gwara BBC na ndị obodo na-ekpe ekpere ka ndị Boko Haram hapụ ibia ọzọ mana ka ihe si dịrị, ọdịka ha na-alọghachi
Mgbe BBC gbara onyeisi Beacon Security na Intelligence Limited, Dr. Kabir Adamu ajụjụ ọnụ ihe mere mwakpo na-abawanye, ọ kwụrụ na ntuziaka nke Islamic steeti nyere ndị mmekọ ha ka ha welite aka na mwakpo, bụ otu n'ime ihe mere ka oji gbawanye.
Ihe ọzọ okwụrụ bụ na tupu oge mmiri ozuzo eruo, ndi na-eyi ọha egwu na ewelite aka na mwakpo ha maka na ọrụ ndị agha na-agbadata n'oge ahụ, dịka ide mmiri na-enye ufọdu ngwa-agha ha nsogbu.
N'agbanyeghị ọnọdụ ahụ, gọọmenti Naịjiria sin a ihe mere oji dịka aha Boko Haram ka n'ewu bụ maka mwakpo ha na-eme na mba ndi ha na Naịjiria nwere agbata obi.
Dị ka United Nations Development Programme (UNDP) si kwuo, ihe karịrị mmadụ 35,000 a nwụọ la n'ihi mwakpo Boko Haram n'etiti 2009 na 2024
Mwakpo ndị a dịka ụlọọrụ UNDP jiri kọwa dịkarirị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'Ugwu Naịjirịa, tụmadị na Bọnu Steeti, ebe ndị otu Boko Haram na ndị otu ha ISWAP gara n'ihu na-egbu ndị mmadụ nkiti ma ndị agha.
Dịka Naịjirịa na-ebuso ọnụahịa na-efeli elu makwa mwakpo niile dị na mpaghara dị icheiche, ndị ọ na-anwa ndị o metụtara.
"Kedụ ihe mbụ anyị kwesịrị ihazi – ọnụahịa nri na ihe ndị ọzọ maọbụ ọnọdụ nchekwa obodo makwa ịgba ọsọndụ anyị?" dịka Harande si kwuo.
Dịka ndị bi n'ime obodo – ndị mwakpo ndị a na-emetụkarịa - na-eru uju ma na-achọkwa ụzọ iwulite ndụ ha, ha na-eme ya n'ụjọ ma na-amaghị mgbe ihe ọzọ ga-eme.
"Ụjo ji ụmụ m, anyị amabeghị ma ọ dịla mma ịlọghachị n'obodo anyị. Ndị agha nọ ebe a, mana anyị enweghị ntụkwasi obi na ihe dịcha mma maka ọnọdụ nchekwa anyị," Hajara Idris (nke a abụghị ezigbo aha ya), gwara BBC ka ndị omekome wakporo Mafa.
Ọ bụghị sọọsọ ya nọ. Fatima Bukar (nke a abụghị ezigbo aha ya) gwakwara BBC na ọ ka na-atụ ụjọ mwakpo ọzọ, ma na-ekwu na "Mwakpo ahụ emela ka obi gbawaa anyị. Anyị ahụla ihe echeghị na anyị kaara ịhụ. Ọ dịka enweghị ebe ezigbo nchekwa dị, ebe ọbụla anyị legharịrị anya. Agbanyeghị na ndị agha dị ebe a, ana m achị aka n'obi maka na amaghị m mgbe ndị Boko Haram nwereike ịlọta."