Agamnihu m nwetara n’ihe karịrị afọ abụọ bụ nnọọ nke dị ezigbo mma - Ademola Lookman
Ademola Lookman bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbara otu egwu bọọlụ Atalanta na Super Eagles nke Naịjirịa.
Aha ya pụtara na nso nso a maka ndị ga-anata ihe nrite Ballon d'Or dịka ọ bụ naanị ya bụ onye Afrịka aha ya pụtara.
Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, Lookman kọwara etu o si hapụ otu egwu bọọlụ Junior Lions nke mba England ma gafere n'otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa.
O kwuru na otu egwu bọọlụ Super Eagles ji obi ha niile nabata ya ma na-egosikwa ya nnukwu ịhụnanya.
Dịka o siri kwuo, ha emechaghị nke ọma n'asọmpi AFCON gara aga na mba Aịvri Kost mana ha nwere ọnụnụokunoobi ime nke ọma karịa na nke ugbua.
Lookman kwukwara okwu gbasara onwe ya dịka ọ sịrị na ya bụ onye na-anọrọ onwe ya n'ihi na ọ naghị ekwu ọtụtụ okwu mana oge ọbụla ọ banyere n'ọgbọ egwuregwu, ọ na-acha ọkụ.
Cheta na Ademola Lookman sụnyere ọkpụ goolu atọ n'asọmpi Europa ikpeazụ bụ nke a kọwara dịka nke mbụ ya kemgbe afọ 1975.



