‘Kemgbe 1999 enwebeghi onye kpalitere mmụọ ndị mmadụ ka Peter Obi’ – Shehu Sani
Sinetọ Shehu Sani etinyela ọnụ n'okwu gbasara ndị Alakụba abụọ (Muslim-Muslim tiketị) nke pati All Progressives Congress (APC) ji azọ ọkwa onyeisiala.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Sani kwuru na iwu obodo Naịjiria amachighi ndị ndọrọndọrọ isi n'okwukwe ọbụla masịrị ha họrọ onye ha chọrọ ka ọ nọchite ha n'ọkwa ntuliaka ọbụla.
Mana ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ n'ihi ụdịrị ọnọdụ Naịjiria nọ n'ime ya mere o ji bụrụ ihe kwesịrị ekwesị na ndị pati ndọrọndọrọ ga-ahọrọ mmadụ abụọ na-anọchi ofufe abụọ dị iche (dịka nke Alakụba na nke okpukpere Kraịst).

Sani kwuru na ọ bụrụ na ya bụ 'Muslim-Muslim' tiketị ndị APC ji azọ ọkwa were gị iwe, na ọ dị mkpa igosi iwe ahụ site n'ịtụnyere pati ndị ọzọ na-ejighi ndị Alakụba abụọ azọ ya bụ ọkwa onyeisiala, "karịa ị na-ebe akwa arịrị maka ya".
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ dị ka imeri ntuliaka afọ 2023 ka pati APC mkpa karịa ime ihe ha kwesịrị ime iji medaa ndị mmadụ obi n'ihi nkewa dị n'obodo.
O kwuru na otu ihe o che mere ndị mmadụ ji na-ewe iwe maka APC ịhọpụta ndị Alakụba abụọ bụ maka na ọ bụ ha bụ pati nọ n'ọchịchị ugbua.
O kwukwara na iwe ha bụ maka na ọ dara nkwekọrịta ha nwere maka ịhọpụta ndị nwere ofufe dị iche iche.
Gbasara nkatọ a na-akatọ Peter Obi bụ onye ji ọkọlọtọ Labour Party azọ ọkwa onyeisiala na soshal midia, o kwuru sị na ọ bụ n'ihi na soshal midia abụrụla ngwaagha e ji alụ agha n'oge ugbua.
O kwuru na ndị pati ndị ọzọ enweela ebe ha gbadoro ụkwụ na mgbọrọgwụ, mana ọ bụ ndị ntorobịa ugbua (bụ ndị juru na soshal midia), bụ ebe mgbọrọgwụ nke Obi dị, na ọ bụ nke a mere ndị pati ndị ọzọ ji achọ isi n'ebe ahụ ọ gbara mgbọrọgwụ nweta ya.
Ọ kọwara etu o si bụrụ Peter Obi mere ka ọ hapụ pati APC sonye Peoples Democratic Party (PDP), mana ka ọ na-abata ka Obi na-ahapụ PDP na-esonye pati Labour.
Gee ihe ndị o kwuru n'uju n'ihe onyonyo a.
Ihe Ị kwesịrị ịma maka Shehu Sani
- Ọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchị, ọ bụbukwa onye Sịnetọ n’ụlọ omeiwu Naịjirịa
- Ọ gbara afọ 55 dịka a mụrụ ya n’afọ 1967
- Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Kaduna Polytechnic ebe ọ natara ọzụzụ na ngalaba Agricultural Engineering
- N’ụbọchị anọ nke ọnwa 2015 ọ bụ onye Sịnetọ mbụ na Naịjirịa kpọpụtara nchekọta ọnụ ego akụnụba ya n’ihu ọha
- N’afọ 2018 o si pati All Progressive Congress (APC) wụba pati Peoples Redemption Party, wee mecha wụbazịe pati PDP
- Ọ bụkwa onye na-ede akwụkwọ nke derela ọtụtụ akwụkwọ
- Ọ bụ onye na-alụ ọgụ ikike dịrị onye nye ndị mmadụ ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ na-enyere ndị mmadụ aka nke a kpọrọ Civil Rights Congress of Nigeria - (CRCN)
- O so na ndị gbara mbọ hụ na ọchịchị onye kwuo uche lọghachịtere na Naịjirịa nke mere ndị ọchịchị ndị agha jiri tụọ ya nga n’oge gara aga
- E merechara tọhapụ ya na nga n’afọ 1999 dịka a tụrụ ya nga mkpụrụ ọka
- Ọ zọrọ ọkwa ịnọchịteanya mpaghara Kaduna Central Senatorial District n’ụlọ omeiwu Naịjirịa n’afọ 2015 ma nweta mmeri na ya.



