Mahadum 'Covenant University' achụọla otu onye ọrụ ha n'ọrụ maka ebubo imetọ ụmụakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images
Mahadum 'Covenant University' amalitere inyocha ebubo na ụfọdụ ndị ọrụ ha na-edina ụmụakwụkwọ n'ike.
Ebubo ahụ malitere wuwe dịka ụfọdụ ụmụakwụkwọ pụtara na-ekwu ihe ha sị ha na-agabiga na soshal midia ụbọchị Monde.

Ebe foto si, Covenant University/Facebook
Kọmiti ndị gụburu na mahadum ahụ (University Alumni Committee) kwuru na ha nwetara mkpesa banyere ebubo a otu izuụka gara aga ma zigara ndị isi ụlọakwụkwọ ahụ ozi.
Ndị isi kọmiti ahụ kwuru sị, "Dịka akụkọ ahụ gbapuru na Twitter n'abalị 21 nke ọnwa Novemba afọ 2022, anyị anụla ya kemgbe otu izuụka ma tinyeanya na ya bụ okwu, anyị na ndị a esorola kpaa iji mata ihe na-eme na ihe ha kwesịrị ime."
A chụrụ otu onye ọrụ maka okwu a

Ebe foto si, screengrab
Komiti ahụ gbara ama na a chụọla otu n'ime ndị ebubo ahụ dara n'isi.
Ha sịrị: "Dịka anyị na ndị isi mahadum na-akpa, anyị nụrụ na a kpọrọ otu onye oku bụ otu na ndị a kpọrọ aha ha ugboro ugboro n'ebubo a na-ebo na soshal midia ka ọ zara ọnụ ya n'ihu otu na-enyocha ndahie n'izuụka ole na ole gara aga."
"Ndịisi mahadum achụọla ya n'ọrụ."
Mana ha akpọghị aha onye ahụ kama ha kwere nkwa iweta ozi ka ya bụ okwu si aga.
Oge BBC Pidgin kpọrọ ndị uweojii Ogun steeti, ọnụ na-ekwuru ha bụ Abimbola Oyeyemi kwuru na ha enwetaghị mkpesa ọbụla n'aka mahadum ahụ, nke ha na-enweta mkpesa n'aka nwata akwụkwọ ọbụla.
Ihe iwu Naijiria kwuru maka iji ndịna emekpa mmadụ ahụ

Naijiria nwere iwu megidere iji ndịna akpagbu mmadụ nke e wepụtara iji chekwaa ụmụnwaanyị na ụmụnwoke; ma okenye ma nwata.
Ha gunyere:
1. Onye nkuzi ọbụla dịnara nwaakwụkwọ ya maọbụ gwa nwata akwụkwọ ka ya na ya dịnaa ya, ga-erite mkpọrọ afọ 14 maọbụ opekatampe afọ ise na-enweghị ụgwọ ọbụla ọ ga-eji etichi ya.
2. Onye nkuzi ọbụla tinyere nwata akwụkwọ n'ụzọ gbagharịa dịka ọ na-agwa ya ka ya na ya dịnaa maọbụ ebe ọ na-agbado ya ga-erite afọ 14 maọbụ opekatampe afọ ise n'ụlọmkpọrọ
3. Onye nkuzi ọbụla jidere, makụọ maọbụ susuo nwaakwụkwọ ọnụ maọbụ metụ ya aka n'ara, ukwu, n'ike maọbụ n'akụkụ ahụ metụtara mmekọ na ọ ga-aga mkpọrọ opekatampe afọ abụọ.









