'Onye ọbụla ji aha omenala eme arụ n'Ezeagu ga-anụ ụda ya' - Onyeisioche Ezeagu bụ Vitalis Ndu

Aha onyonyo, ‘Onye ọbụla ji aha omenala eme arụ n’Ezeagu ga-anụ ụda ya’ - Onye isioche Ezeagu bụ Vitalis Ndu
'Onye ọbụla ji aha omenala eme arụ n'Ezeagu ga-anụ ụda ya' - Onyeisioche Ezeagu bụ Vitalis Ndu

Onyeisioche okpuru ọchịchị Ezeagu n'Enugwu steeti bụ Maazị Vitalis Ndu enyela ndị na-achị obodo niile nakwa ndị nchekwa 'Neighbourhood Watch' ntuziaka ka ha sie imi n'ala chọpụta ndị niile ji aha dibịa omenala egbu ma na-atọ ndị mmadụ.

Ndu gwara BBC News Igbo nke a oge anyị na ya nwere mkparịtaụka maka nchọpụta a chọpụtara dibịa na-egbu mmadụ aha ya bụ Onyeka Nwaobu, onye e ji Ozo Ezeani, ichie million, e dey play e dey show wee mara.

Ya bụ mkpamkpa kpara n'ụbọchị 26 nke ọnwa Mee, afọ 2025 ka na-ama ndị mmadụ akpataoyi n'ihi na nwoke ọjọọ ahụ gburu nwaanyị dị ime nakwa otu nwoke, dobe ozu ha n'okpuru ụlọ ọhụrụ ọ na-arụ.

Aka ndị nche 'Neighbourhood Watch' kpaara ya bụ nwoke ka ọ tọọrọ nwata nwaanyị gbara afọ iri na atọ ka o gbuo ya. Mkpu nwata ahụ tiri mere ka ndị nche nwụchie ya.

Onyeisioche Ezeagu dọrọ aka na ntị na a ga-enyocha onye ọbụla nọ n'Ezeagụ arụ ọrụ dibịa ka a mara nke ọ na-eme.

O kelere ndị obodo Umuojo Isiagu dị n'Umumba Ndi-Agu ka ha siri pụta n'igwe gbaa ihe ọjọọ n'anwụ. Ndu gwakwara ndị ọzọ ka ha ṅọmie ndị Umuojo chọpụta arụ na-eme n'obodo ha.

N'ihe gbasara ịmata ozu abụọ ahụ, Maazị Ndu kwuru na nnyocha DNA ndị uweojii na-eme ugbua ga ekwu ndị ha bụ.

"Ọ bụ eziokwu na ụmụakwụkwọ Central School Umunba Ndị-Agu mere ngagharịiwe sị na nwata nwoke ahụ a hụrụ ozu ya bụ nwataakwụkwọ ha, mana biko onye ọbụla dere jụụ ka e mechaa nyocha".

"Ụnụ ahụla na e jidela Ozo Ezeani n'ụzọ Kotonu ebe ọ chọrọ ịgbapụ. Nke a gosiri na ị gaghị egbu mmadụ n'ala Ezeagu laa na nkịtị," ka Maazị Ndu kwuru.

Ka ọ dị ugbua, ndị ụlọọrụ Immigration jidere ya bụ nwoke enyefeela ya n'aka ndị uweojii ka nnyocha malite n'uju.

Ndị ọrụ ya na-atọtara ya mmadụ nọzị n'aka ndị uweojii ugbua.