You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee Ji Han so na mmadụ 154 nwụrụ n'ọdachi 'stampede' na South Korea
Otiegwu na onye ihe ejije a ma ama bụ Lee Ji Han so na mmadụ 154 nwụrụ dịka ndị mmadụ dagidere onwe ha n'emume 'Halloween" e mere na South Korea na mgbede Satode, ụbọchị 29 nke Ọktoba 2022.
Nsogbu dapụtara dịka ndị na-eto eto, ọkachasị ndị nọ n'agbata afọ 20 gara n' Itaowen, isi obodo South Korea, maka emume 'Halloween', nke mbụ ya a na-ewepụ mmachi ụdị ọgbakọ a n'ihi Covid-19, bụ ebe igwe mmadụ karịrị etu a tụrụ anya.
Ụfọdụ ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ihe ruru mmadụ 100,000 pụtara maka Halloween n'ihi obi ụtọ ime oriri na nkwarị kemgbe afọ abụọ a machiri ụdị ọgbakọ ahụ n'ọha n'ihi nsogbu Covid-19.
Dịka mịnịstri na-ahụ maka agụmakwụkwọ na nke na-ahụ maka nchekwa mba ahụ si kwuo, ndị ọzọ nwụrụ gụnyere ndị mba ọzọ mmadụ 26, ụmụakwụkwọ isii, ndị nkuzi atọ na ndị agha mba South Korea atọ.
Ha gụnyere:
Lee Ji Han, 24, onye ihe ejije
Lee Ji Han so na ndị a zọgburu n'abalị Satode.
Nwa amadị a bụụrụ onye a ma ama dịka o sonyere n'asọmpi e ji ahọpụta onye nwere nka n'ịkpa obi ụtọ a kpọrọ "Produce 101".
Ndị na-anọchite Ji Han ndị wepụtara ozi gbasara nke a n' Instagram sị, "Ọ bụ eziokwu na Lee Ji anwụọla n'ihe mberede mere n'Itaewon."
"Ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị nwụrụ n'ọdachi ahụ karịrị nke ụmụnwoke."
"Anyị na-enwebu olileanya ka ọ ghara ịbụ eziokwu mana ọ riri anyị ọnụ ịnụ ya bụ akụkọ.
"Ezinaụlọ ya nọ na nnukwu iru ụjụ, ya mere anyị ji akpachapụ anya. Ka o zuru ike na ndokwa."
Ndị ihe nwa amadị a na-amasị tụkwara arịrị maka ọnwụ ya.
Grace Rached, 23 , onye na-emepụta onyonyo
Gọọmentị mba Ọstrelia ekwuola n'ezie na nwa amaala ha bụ Grace Rached nke ga-agba afọ 24 n'ọnwa na-abịanụ so na ndị nwụrụ.
N'ozi ha wepụtara, ezinaụlọ ya kwuru sị, " Grace bụ "mmụọozi mara mma," na "onye na-eme ka eweta aṅụrị ebe ọ bụla ọ batara".
"Grace na-akpọ mmadụ mmadụ ma nwekwa obioma nye onye ọbụla o zutere." "O jighị ụmụnne ya nwaanyị abụọ egwu egwu, ọ bụ nwa onye na-egosi agwa kwesịrị nṅomi."
Ndị ya na ya na-arụkọ nakwa na ndị enyi ya ezipụtala ozi na-ekwu maka ndụ ya."
Steve Blesi ,20, nwata akwụkwọ
Nwaokorobịa gbara afọ 20 a kpọrọ Steve Blesi, onye Amerịka, na nna ya soro gaa emume ahụ mana nwata ahụ ejighị isi ya pụta.
N'ozi nna ya zipụtara na Twitter tupu a mata n'ezie na nwata ahụ nwụrụ anwụ, o kwuru na nwa ya nọ nso ebe a zọgidere ndị mmadụ ma rịọ enyemaka n'ịchọta ya.
Anne Gieske, 20 , nwata akwụkwọ
Anne Gieske gbara afọ 20, bụ nwa akwụkwọ mahadum 'University of Kentucky mere njem gaa Seoul dị na South Korea.
Nwaada ahụ na-agụ nọọsụ hiwere ọbaozi maka njem akwụkwọ ọ gara na South Korea ma zipụta ozi maka ime afọ 20 n'akara Instagram ya.
Nna ya bụ Dan kọwara Anne dịka "nwa nke onye ọbụla hụrụ n'anya."
Ọ gwara ụlọntaakụkọ NBC News na ihe mere ha gbarriri ha obi.
Ndị ma Anne kọwara ya dịka onye obi ọma.